Prostate Cancer: Gịnị bụ ọrịa a e kwuru gburu Pete Edochie na etu e nwereike isi gwọọ ya?

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa prostate kansa bụ ọrịa ndị dọkịnta chọpụtara kachasị arịa ụmụnwoke ụwa niile gbaa gburugburu. Mana nnyocha e mere chọpụtara na ihe ruru ụmụnwoke 55,000 na-arịa ọrịa a kwa afọ na mba UK.
Naanị obere ọnụọgụgụ ụmụnwoke nọ n'ihe ize ndụ dị elu bụ ihe tozuru etozu maka nyocha ugboro ugboro ọrịa prostate kansa, n'ihi na ọtụtụ ihe ize ndụ ndị na-esite n'ule ọbara a na-eji eme nnyocha ahụ karịrị uru dị na ya.
N'agbanyeghị nke a, ọtụtụ puku ụmụnwoke isi ojii dị afọ 45 ruo 74 na-aga nnyocha iji mee ntule nwale a na-eme dịka a na-achọ ụzọ ka mma isi chọpụta ọrịa a.
Gịnị bụ kansa prostate?
Ọ gbara urethra bụ ọwa na-ebufe mmamịrị site n'akụkụ ahụ gaa n'èzí site n'amụ nwoke gburugburu.
Kansa prostate, nke bụ uto sel na-adịghị mma na nke a na-achịkwaghị achịkwa, na-etolitekarị nwayọọ nwayọọ.
Nchọpụta kwuru na oge ụfọdụ, onye nwere ọrịa a nwereike ọ gaghị ahụta ihe njirimara ọrịa a ruo ọtụtụ afọ maọbụ nwee nsogbu ọbụla sitere na ya n'oge ndụ ha.
Mana nye ụfọdụ, njirimara ya na-adị njọ.
Ndị ọrụ ahụike kwuru na a achọpụta ọrịa kansa prostate n'oge, e nwereike ịgwọ ya.
Ọrịa Prostrate kansa bụ ọrịa ọjọọ na-adị n'akpa mamịrị ụmụnwoke, bụ nke gburula ọtụtụ ụmụnwoke gụnyere Pete Edochie, Rotimi Akeredolu bụbu Gọvanọ Ondo state nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.
Mmadụ ole ka kansa prostate na-eme?

Ebe foto si, Getty Images
Otu n'ime ụmụnwoke asatọ nwereike inwe ọrịa kansa prostate mana a bịa na ndị isi ojii, ọ bụ otu nwoke n'ime ụmụnwoke anọ.
Ndị ọrịa prostate kansa na-emekarị bụ ụmụnwoke ruru afọ 75 maọbụ karịa. A naghị ahụkarị ụmụnwoke na-erubeghị afọ 50 nwere ọrịa prostate kansa.
Nnyocha kwuru na I nwereike inwe ọrịa prostate kansa ma ọ bụrụ na nna gị, nwanne gị nwoke, nwanne nna gị maọbụ nna nna gị rịara ọrịa prostate kansa.
Ụfọdụ ihe ndị na-eme ka ọrịa ahụ bịa n'ahụ mmadụ ọsịsọ maọbụ mee ka ọ bawanye gụnyere:
- Afọ ole ị dị - E cheere na ọrịa ahụ na-aka emetụta ndị gafere afọ 50.
- Agbụrụ - Nyocha gosiri na ọ bụrụ na ọrịa akpụ akpa mamịrị maọbụ ọrịa akpụ ọbụla dị n'agbụrụ gị, ị ga-enweike ịbute ya.
- Nri - Ndị sayensị nwere obere akaebe na-egosi na nri ndị nwekarịrị 'calcium' n'ime ya na-ebute ọrịa a.
- Ibu oke ibu- Nyocha gosikwara na ndị buru oke ibu nwereike ibute ọrịa mana n'aka nke ọzọ, imegharị ahụ nakwa iri nri zuroke na-enyeaka ibelata ohere ibute ọrịa a.
Kedụ njirimara ọrịa prostate kansa?
Ụfọdụ njimara ọrịa prostate kansa gụnyere ịyụ oke mamịrị ọkachasị n'abalị, inwe nsogbu ịyụ mamịrị maọbụ mamịrị na-agba ntakịrị ntakịrị maọbụ inwe ọtụtụ oge ịyụ mamịrị.
Ọzọ bụ inwe ọbara na mamịrị gị.
Njirimara ndị a bụ ọtụtụ ihe dị iche iche nwereike ịkpata ya. Ọ bụ nke a mere o ji dị mkpa ka ị ga hụ dọkịta gị maka nnyocha zuruoke.
Kedụ ka e si agwọ ọrịa prostate kansa?
E nwere usoro ọgwụgwọ dị iche iche dị maka ọrịa prostate kansa. Ọ bụ dọkịta gị ga-adụ gị ọdụ gbasara nke kacha adabara gị.
Ọ bụrụ na a chọpụta kansa ahụ n'oge mbụ ma ọ naghị egosi njirimara ọbụla maọbụ na-eto ngwa ngwa, enwere ike hapụ ya ma na-elebanyere ya anya mgbe niile.
E nwereike ịgwọ ụfọdụ ụdị ọrịa prostate kansa kpamkpam site n'iji ọgwụgwọ dịka ịwa ahụ (surgery) na ọgwụgwọ radieshon (radiotherapy).
N'ọnwa Juun 2026, ụlọọrụ NHS mba UK kwuru na a ga-enye ndị nwoke nwere kansa prostate nke dị n'ihe ize ndụ dị ala na nke etiti ọgwụgwọ radieshon dị ike (a na-akpọ ya SABR).
A ka na-eme nnyocha iji chọpụta ma a pụrụ iji ọgwụgwọ radieshon na ndị ọrịa nwere kansa prostate nke nọ n'ihe ize ndụ dị elu.
Ọgwụgwọ homonụ (hormone therapy) nwekwara ike inye aka n'ibelata maọbụ n'ịkwụsị eto kansa ahụ si eto.
E nwekwara ike iji oke oyi (cryotherapy) bibie mkpụrụ ndụ kansa ahụ maọbụ ultrasound siri ike nke a a kpọrọ high-intensity focused ultrasound.


























