Pete Edochie na-eme ejije anwụọla ka ọ gbara afọ 79

Ebe foto si, Pete Edochie
Onye na-eme ejije a ma ama bụ Pete Edochie anwụọla dịka ọ gbara afọ 79.
Ozi nwa ya nwoke bụ Leo Edochie wepụtara kwuru na Pete Edochie nwụrụ n'ụtụtụ Wenezde 25 Nọvemba 2026 n'Enugu state
Ozi ahụ kwuru na ọ rịara ọrịa prostate cancer tupu ọ nwụọ.
Pete Edochie bụ onye obodo Akamnato Ifite Nteje dị n'okpuru ọchịchị Oyi, n'Anambra state.
Ndị ọ hapụrụ na-eriri ya uju gụnyere nwunye ya bụ Josephine Edochie, ụmụ ya, ụmụnne ya nakwa ọtụtụ ndị agbataobi.
Ozi a kwuru na ezinaụlọ ya ga-ewepụta ozi banyere usoro oliliozu ya mgbe oge ya ruru.
Onye bụ Pete Edochie?
A mụrụ Pete Edochie na Maachị 7 1947 n'Enugu State.
Nna ya rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ Nigerian Railways. Ọ bụ ọrụ a kpọgara nna ya Kaduna state bụ ebe Pete nọ too dịka nwatakịrị.
Pete Edochie gara ụlọakwụkwọ Saint Patrick's na Saint James Primary Schools na Zaria tupu ọ gaa ụlọakwụkwọ Saint John Secondary School, Kaduna, n'afọ1960.
Ka afọ anọ gara, ọ hapụrụ ụlọaakwụkwọ ga soro nna ya rụọ ọrụ n'ụlọọrụ Railway ahụ. N'afọ 1966 dịka agha tiwapụrụ na mpaghara ugwu Nigeria, ọ hapụrụ ebe ahụ tupu agha ime obodo Bekee kpọrọ civil war amalite.
Oge ọ dị afọ 20, Pete Edochie nwetara ọrụ n'ụlọọrụ mgbasaozi Eastern Nigerian Broadcasting Corporation.
N'afọ 1980, o nwetara ọzụzụ n'ụlọọrụ British Broadcasting Corporation ma rigoo n'ọkwa dị elu ma mechaa bụrụ onyeisi mbụ ụlọọrụ Anambra Broadcasting Service 3FM Stereo n'afọ 1987.
Ọ lara ezumike nka otu afọ oge gọọmenti malitere itinye aka ha n'etu ụlọọrụ ahụ si arụ ọrụ.

Ebe foto si, Pete Edochie/Instagram
Tupu ọ hapụ ụlọọrụ ahụ, Pete Edochie nwetara ohere ime ejije dịka Okonkwo n'ejije Things Fall Apart, nke bụ nkọwa akwụkwọ ahụ Chinua Achebe dere.
Pete Edochie mụrụ ụmụaka isii gụnyere ndị na-eme ejije a ma ama bụ Yul na Linc.
E debanyere aha ya Hall of Fame ndị na-eme ejije n'afọ 2000, o ritere onyinye AMAA Industry Merit Award n'afọ 2014 nakwa City People Lifetime Achievement Award n'afọ 2016.
N'afọ 2025, mahadum ISTM University turu ya ugo ma nye ya ọkwa Doctorate of Arts in Excellence, Leadership and Development.


























