Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 9, 2026

Aha onyonyo, Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 9, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 9, 2026
Mgbe e biputara ya

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Gọọmenti Nigeria ekwuola na ha ga-ebudata ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Nigeria n'ime ụbọchi iri atọ atọ site n'ụlọọrụ ha na-ere mmanụ ụgbọala bụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC).
  • Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba bụ Taiwo Oyedele kwupụtara nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọzde 9 Ọktoba 2026 ma sị na ha anaghị eweghachite ego enyemaka mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'subsidy' n'olu bekee bụ nke ha wepụrụ n'ọnwa Mee 2023.
  • Mkpesa na ngagharịiwe emeela na mpaghara ụfọdụ na South Africa n'ihi mbata na obibi ndị mbịarambịa na-enweghị akwụkwọ ikike nke iwu kwadoro.
  • Ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ dịka a kpọrọ ụgbọala ọkụ na Soweto na Durban, ebe akụkọ kwuru na ndị ngagharịiwe a lekwasịrị anya n'ụlọahịa ndị mbịarambịa nwere.
  • E kwuru na ngagharịiwe yiri nke a mere na Cape Town nakwa mpaghara Eastern Cape.

Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.

Foto e dere Akụkọ dị mkpa
Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
BBC IGBO
Nkọwa foto, Whatsapp Chanelu BBC IGBO