Etu e si gbuo Umukoro Efemena na ndị ọzọ n'emume ịchụnta vootu ndị NDC na Delta state

Ebe foto si, Comr Umukoro Efemena / Facebook
Ndị ojiegbe gbagburu mmadụ isii bụ ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria Democratic Congress (NDC) n'oge Sịnetọ Ovie Omo-Agege na-eme ngaghalị ịchụ nta vootu n'abalị garaaga bụ Nọvemba 24 2026.
Nke a mere n'obodo a na-akpọ Uduere, n'okpuru ọchịchị Ugheli North dị na Delta state.
Mmadụ isii nwụrụ na mkpamkpa ahụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ a gbara egbe nọ n'ụlọọgwụ ugbua.
N'ime mmadụ isii nwụrụ gụnyere Moses Anaughe na Akima Efemena Umukoro bụ ndị na-arụrụ Sịnetọ Ovie Omo-Agege ọrụ.
Sịnetọ Ovie Omo-Agege bụ sịnetọ na-anọchịtaanya mpaghara Delta Central ma jiri ọkọrọtọ Nigeria Democratic Congress (NDC) na-azọ ọkwa ahụ n'afọ 2027.
Etu mkpamkpa a si kpaa - Sịnetọ Ovie Omo-Agege

Ebe foto si, Senator Ovie Omo-Agege / Facebook
Sịnetọ Ovie Omo-Agege dịka anyị si kọwaa bụ sịnetọ na-anọchịtaanya mpaghara Delta Central ma jiri ọkọlọtọ Nigeria Democratic Congress (NDC) na-azọ ọkwa ahụ n'afọ 2027.
Mkpamkpa a kpara n'emume Omo-Agege ji na-achụ nta vootu n'obodo a na-akpọ Uduere, n'okpuru ọchịchị Ugheli North na steeti ahụ mgbe ndị omekome wakporo ha ma bido na-agba ndị mmadụ egbe aghara aghara.
N'ozi Sịnetọ Ovie Omo-Agege wepụtara n'akara soshal midia ya ka ọ kọwara etu e si wakpoo ha ma kwuo na "ndị hụrụ mgbe ndị ojiegbe ahụ bịara sị na ha bidoro na-agba ndị mmadụ egbe aghara aghara".
"Ndị hụrụ ha kwuru na ha na-aba mba na-ekwu sị na ọ bụ 'Sinetọ Omo-Agege ka ha chọrọ igbagbu'.
Mana ha kọwara na "Sịnetọ Omo-Agege na-agwa ndị mmadụ okwu n'oge ihe ahụ na-eme. Ọzọ bụ na mgbọ egbe gafere Omo-Agege n'akụkụ isi ya, ma kwuo na ọ bụ amara Chineke zọrọ ya ndụ".
A na-ekwu na-enweghị ndị na-ese okwu, maọbụ na-anụ ọgụ mgbe ihe a bidoro mana "ihe mere bụ nkata ndị mmadụ kpara iji gbuo Sịnetọ Omo-Agege" dịka ozi ahụ si kwuo.
Ogbugbu na mwakpo ndị nkwado anyị na-agba anya mmiri - Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook
Peter Obi ji ọkọlọtọ NDC na-azọ ọkwa Onyeisiala Nigeria katọrọ etu e si mwakpo ma gbuo ndị mmadụ n'emume ịchụnta vootu patị ha na Delta state.
Obi sị na ọ dị njọ na "e gburu ndị mmadụ naanị maka otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha na-akwado ma kpokuo ndị ọrụ nchekwa ka ha mee ezigbo nnyocha benyere ihe mere".
N'okwu ya "anam eziga ozi itiaka n'obi nye ezinaụlọ ndị nwụrụ ma na-ekpe ekpere ka ndị merụrụ ahụ gbakee".
"Anam agwa ndị ọrụ nchekwa ka ha mee ezigbo nnyocha maka ihe mere ma nye ndị nwụrụ ikpe ziri ezi".
Obi gara n'ihu kwuo na "ụmụamaala Nigeria niile nwere ikike ịchụnta vootu na-enweghị ndị na-amaja ha ma kwuo na ndị gọọmenti kwesiri ịchekwa ndị na-eme ndọrọ ndọrọ ọchịchị".
Obi kwuru na "nghọtafe ọbụla bụ ihe e kwesiri imezi site n'ịkpakọrịta nkata nakwa na ntuliaka, na ọ bụghị site n'ịkwa mgbọ egbe".

Ebe foto si, Senator Ovie Omo-Agege / Facebook
Lee aha ndị nwụrụ nakwa ndị merụrụ ahụ
Otu onye aha ya kacha ada ụda na ndị nwụrụ na mkpamkpa ahụ bụ 'Comrade' Akima Efenena Umukoro.
Efenena Umukoro bụbu Onyeisi otu a na-akpọ Urhobo Progress Union (UPU) nke ngalaba ndị ntorobịa otu ahụ.
Ndị ọzọ nwụrụ gụnyere:
- Moses Anaughe bụbu 'Federal Commissioner' na Federal Character Commission.
- Nyoren Okoro bụ onye otu patị NDC nakwa ndị ọzọ amabeghị aha ha mgbe akụkọ a na-apụta.
Mana mmadụ iri na ise ndị merụrụ ahụ gụnyere Evance Ivwurie nakwa Chuks Erhire.





























