Etu ndị a ma ama si eru uju maka ọnwụ 'Ogadagidi' bụ Pete Edochie

Ebe foto si, Pete Edochie/Instagram
Akwa arịrị, okwu ọma, na okwu otito ka ọtụtụ ndị a ma ama ji eru uju maka ọnwụ Pete Edochie, onye a maara na-eme ihe ejije Nollywood, bụ onye lara mmụọ n'isi ụtụtụ ụbọchị Wenezde 25 Nọvemba 2026.
Ezinụlọ Edochie kwupụtara ọnwụ dịka ha kọwara na ọ rịara ọrịa 'prostate cancer' tupu ọ nwụọ.
Ma ndị ejije Nollywood, ma ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ a ma ama ewepụtala ozi iti aka n'obi iji kasie ezinụlọ Edochie obi, ma kwukwaa ihe ha ma gbasara Ide ndịIgbo a, onye nwere ọtụtụ aha otutu e ji mara nke otu n'ime ha bụ Ogadagidi.

Ebe foto si, Yul Edochie/X
Funke Akindele, onye na-eme ejije a ma ama, kwara arịrị n'ozi o depụtara n'akara X ya ma kọwaa etu Pete Edochie si bụrụ otu n'ime ndị jalitere mmụọ ya n'ime ejije.
Akindele dere sị: "Echetara m etu m si ekiri gị n'ejije 'Things Fall Apart' oge m na-etolite. Ka ọtụtụ afọ gachara, enwere m ohere mụ na gị ịrụkọ ọrụ n'ejije 'Egg of Life". Okwu mgbamume ị gwara m ụbọchị ahụ nọgidere n'ime m."
Akindele bụ onye mepụtara ejije kacha ree ahịa kamgbe e hibere ngalaba ejije Nollywood.
Onye ntaakụkọ a ma ama na Nigeria bụ Rufai Oseni, depụtakwara ozi gbasara ọnwụ Ichie Edochie, bụ onye kwuru na ha abụọ gụkọrọ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị St John's College a na-akpọzị Rimi College ugbua, na Kaduna, mana Edochie tọrọ ya nke ọma na klaasị.
"Pete abụghị naanị odogwu n'imepụta ejije, ọ bụ odogwu mmadụ. Mmadụ nwere amamihe, nwee nkwanye ugwu, mara etu e si atụ ilu, ma bụrụkwa onye siri ike," Oseni dere.
"Nnukwu dimkpa anwụlahụla Nigeria. Nnukwu nna anwụlahụla ndị ejije Nollywood. Nnukwu enyi anwụlahụla m."
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Onye ọzọkwa dere ozi iru uju maka ọnwụ bụ Pat Utomi, onye ọkammụta n'okwu gbasara akụnụba nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
"Taa, Nigeria na-eru uju maka ọnwụ, ọbụghị naanị onye na-eme ihe ejije, kama ọ bụ onye bụ njirimara ọdịnala, onye nlekọta akụkọ ọnụ Africa, nakwa nwoke olu ya, ihu ya nakwa akparamagwa ya bụ nnukwu ihe ncheta nye anyị niile," ka Utomi dere.
Ugboro ugboro ka akụkọ asịrị wusara na Pete Edochie alaa mmụọ, mana kwa oge, ndị ezinụlọ ya, nakwa ya onwe ya na-apụta kwuo na akụkọ ndị ahụ bụ akụkọ ụgha. Mana ugbua, ya bụ akụkọ abụrụla eziokwu.
Otu a ka May Yul-Edochie, bụ nwunye nwa Ogadagidi si malite ozi o depụtara n'akara Facebook ya iji kwaa arịrị maka ọnwụ nna di ya.
May kọwara Pete Edochie dịka onye ọtụtụ ji mere nna, nakwa onye ọrụ ya na njirimara ya agaghị enwe nchefu.
"Otu ihe doro anya bụ na ndị bụ odogwu anaghị anwụ anwụ, ha na-adigide ndụ n'ime ihe ncheta ha merela nakwa ndị ha metụrụ ndụ ha aka," ka o dere.




























