Cyril Ramaphosa nke South Africa emeriela n'ụlọikpe dịka a kagburu mbọ a na-agba iwepụ ya n'ọkwa

Ebe foto si, Gallo via Getty Images
- Onye dere ya, Khanyisile Ngcobo
- Ebeg o si, Johannesburg
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Onyeisiala mba South Africa bụ Cyril Ramaphosa enwetala mmeri n'ụlọikpe dịka ụlọikpe kagburu nchọpụta nyocha kwuru na o nwere ajụjụ ọ ga-aza gbasara ohi ego dị $580,000 e zuuru n'ọrụ ugbo dị na Phala Phala mpaghara Limpopo.
Ụlọikpe ukwu nke Western Cape kpebiri na nnyocha kọmitii nọọrọ onwe ya nke ndị omeiwu họpụtara n'afọ 2022 megidere iwu, ma kagbuo ya kpam kpam.
Onye Ọkaikpe bụ Nolwazi Mabindla-Boqwana kwuru na kọmitii ahụ gafere oke ọrụ e nyere ya, ma ghọtahie ọrụ ya na iwu gbasara nnyocha ahụ.
Mkpebi a kagburu isi ihe mere ndị omeiwu ji malite usoro ịchụpụ Ramaphosa n'ọkwa onyeisiala.
Ramaphosa wepụtara okwu ahụ n'ụlọikpe iji maa mpụtara nnyocha ahụ aka dịka ụlọikpe kwuru ndị omeiwu dara iwu ma kpochie mbọ ha chọrọ ịchụpụ ya n'ọchịchị.
Etu esemokwu ego e zuru n'ọrụ ugbo Ramaphosa si malite
Esemokwu a malitere n'afọ 2022 mgbe onye bụbu onyeisi ndị mgbaama nzuzo South Africa bụ Arthur Fraser boro Ramaphosa ebubo na o zoro izu ohi ego e mere n'ugbo ya n'aka ndị uweojii na ndị ọrụ ụtụisi.
A na-ekwu na ndị ohi zuru ego dị n'akwụkwọ ego dọla America e zoro n'ime oche n'ugbo ahụ n'afọ 2020.
Ramaphosa kwetara n'ezie na e zuru ohi n'ugbo ya, mana ọ kọwara na ego ahụ bụ nke o nwetere site n'ire enyi ọhịa 'Buffalo' n'ụzọ ziri ezi bụ nke ọ na-azụ.
Na-agbanyeghị nkọwa ahụ, kọmitii ndị omeiwu hiwere kwuru na e nwere nnukwu obi abụọ gbasara ebe ego ahụ si bịa, wee kpebie na onyeisiala kwesịrị ịza ajụjụ.
Na mbido ọnwa Nọvemba 2026, ikpe maara mmadụ abụọ maka izu ego ahụ.

Ebe foto si, Gallo via Getty Images
Ihe mkpebi ụlọikpe a pụtara
Mkpebi ụlọikpe ahụ enyela Ramaphosa nnukwu mmeri ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n'agbanyeghị na ọ bụghị mkpebi na-asachapụ ya kpamkpam n'ebubo gbasara ihe mere n'ugbo ahụ.
Ndi otu na-agba goomenti ukwu ekwuola na ha na ndị ọkaiwu ha na-akparịta ụka iji gbaa akwụkwọ mkpegharị megide mkpebi ahụ.


























