Aka akparala otu nwafọ Nigeria na ndị Mexico ise na-esipụta mkpụmmiri n'Enugu State

Ebe foto si, NDLEA
A nwuchiela otu nwafọ Nigeria na ndị Mexico ise nwere ọdọ ebe a na-esipụta ọgwụike Methamphetamine e ji mkpụrụmmiri maara n'Enugu State dịka ụlọọrụ na-ebuagha megide ọgwụike bụ NDLEA si kwuo.
A hụrụ ọgwụike mkpụrụmmiri a nke tonne ya bụ 1.5 gụnyere nke dị n'ụdị a rụchara arụcha nakwa nke a ka na-esipụta.
Ụlọọrụ NDLEA kwuru na ọnụego ọgwụike ndị a pụtara $226.8m (N303.9bn).
Nke a ga-abụ ogige anọ ebe a na-esipụta ọgwụike n'ebe o buru ibu a ga-achọpụta na Nigeria bụ nke ha na ndị na-esi ọgwụike si na Mexico nwere mmekọ.
Nwafọ Nigeria bụ ojiego achụ ego a kpọrọ Chuks Enoch Ezeike dị afọ 63 e ji "Over Size" maara ka a na-ebo ebubo na ọ bụ ya hiwere ogige ahụ ma zubata ụmụafọ Mexico ise na Nigeria site n'iji akwụkwọ njem adịgboroja nke Argentina, Colombia na Chile.
Ụlọọrụ NDLEA kwuru na ndị Mexico ise a gụnyere Oscar Ramos-Cardenas a sị bụ onyendu ha, Juan Antonio Sarabia-Cabrera, Luis Enrique Garcia-Amador, Jose Alejandro Renteria-Reyes na Salomon Cabanillas-Torres.
Ndị Mexico a bi n'otu ogige ahụ ha na-esipụta mkpụrụmmiri a nke dị n'azụ ụlọọrụ ebe a na-ere mmanụ agbidi nke mere ka anya ndị mmadụ ghara ịdị na ya.
Mohamed Buba bụ Onyeisi ụlọọrụ NDLEA mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Wenezde kwuru na a nwuchiri ndị a site na nnyocha ọnwa asaa e mere ha.

Ebe foto si, NDLEA
O kwuru na ha malitere inyocha Ezeike kamgbe ọnwa Eprel mgbe ha nwetere kepukepu na ya na Oscar Ramos-Cardenas nwafọ mba Mexico a na-enyo enyo na-esipụta ọgwụike mkpụrụmmiri n'ebe o buru ibu na-enwe mmekọ.
N'ọnwa Ọgọst, ụmụafọ Mexico ise a bịara n'isiobodo Nigeria bụ Abuja mana a jụrụ ịbata kama a chụghachịrị ha na Mexico.
Dịka ọnwa atọ gachara, ha nwara ịbata na Nigeria ọzọ, site na mba Colombia gaa France si na ya jiri akwụkwọ adịgboroja bata Benin.
Mana a sị na Ezeike mechara nabata ha na Lagos tupu o duru ha gawa n'Enugu State ebe anya ndị NDLEA na-ele ha kamgbe ahụ.
Ihe karịrị ndị ọrụ NDLEA mmadụ narị abụọ ka e du gaa ọrụ ahụ n'ụbọchị 11 Nọvemba 2026 ebe ha wakporo ogige ahụ nakwa ụlọ ndina Ezeike nọ na ya.

Ebe foto si, NDLEA
Ha nwufchiri ndị Mexico ise a dịka ha nọ n'ihu ọrụ na-esipụta ọgwụike, Ezeike kwuru na ha kwesịrị ịhapụ Nigeria n'ime abụọ.
A hụkwara akụrụngwa kemịkal dị iche iche e ji esipụta ọgwụike meth a nakwa ngwaọrụ ndị ọzọ.
NDLEA kwuru na Ezeike kwetere n'ezie na ọ bụ ya nwee ogige ahụ ma kpọbatakwa ndị Mexico ise ahụ iji nyere ya aka ịrụpụta ọgwụike a.
Ụlọọrụ a kwuru na ndị a so n'otu na-akpa ike na mbaụwa n'isipụta ọgwụike nke ndị cartel na Mexico nọ n'isi ya ebe ndị Nigeria na-enyere ha aka inye ha ogige nakwa ihe ndị ọzọ e ji esipụta ọgwụike ndị a.
Nwuchi a na-abịa dịka a na-atụle etu ndị cartel ọgwụike mba Mexico si ehiwe ọtụtụ ebe a na-esipụta ọgwụike na mpaghara West Africa, ebe a na-ahụta dịka ntọala ebe a na-esi ebupụ ọgwụike kamgbe ọtụtụ afọ.
Na mbido afọ a, ndị ọrụ gọọmenti Nigeria chọpụtara ebe a na-esipụta ọgwụike dị etu a n'Ogun, Oyo nakwa Ebonyi State.
Nke a ga-eme ya ụmụafọ Mexico iri a na-enyo enyo na-esipụta ọgwụike na Nigeria a ga-anwuchi n'ime ọnwa ole ma ole dịka NDLEA si kwuo.
Mmadụ ise a nwuchiri na mbụ nọ n'ụlọikpe ugbua na-azara ọnụ ha.
Marwa bụ onyeisi NDLEA dọrọ ndị a ka na ntị na "Nigeria abụghị ebe a na-esipụta ọgwụike, ọ bụghị ụlọ nchekwa ọgwụike maọbụ okporo e si ebupụ ha."


























