Ọgbaaghara dapụtara na South Africa mgbe ụmụafọ ha na-achọ ịnapụ ndị mbịarambịa ụlọahịa ha n'ike

Ndị ọrụ South African Police Service (SAPS) na-enyere ndị bi na mpaghara ahụ aka ịchọta ebe nchekwa ma chebe onwe ha pụọ n'ihe ize ndụ.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mkpesa na ngagharịiwe emeela na mpaghara ụfọdụ na South Africa n'ihi mbata na obibi ndị mbịarambịa na-enweghị akwụkwọ ikike nke iwu kwadoro.

A kpọrọ ụgbọala ọkụ na Soweto na Durban, ebe akụkọ kwuru na ndị ngagharịiwe a lekwasịrị anya n'ụlọahịa ndị mbịarambịa nwere. Ọtụtụ mmadụ emerụla ahụ.

Ngagharịiwe nke malitere n'udo na Orlando West dị na Soweto, nke na-akpọ oku ka e mechie obere azụmahịa ndị mbịarambịa nwee, ghọrọ ihe ike mgbe e kwuru na ndị ngagharịiwe ahụ nwetara mgbọ sitere n'aka ụfọdụ mmadụ, dịka ndị bi ebe ahụ siri kwuo. A kpọrọ ụgbọala iri ọkụ.

Na Durban, ọnọdụ ọgbaaghara juru ebe niile ka a na-akpọ ụgbọala ọkụ ma na-ịnapụ ụlọahịa ihe. Ndị uweojii kwuru na ejidela ndị mbịarambịa ọzọ mmadụ atọ maka ebubo na ha wakporo otu onye na-eme ngagharịiwe.

A kọkwara na ngagharịiwe yiri nke a mere na Cape Town nakwa mpaghara Eastern Cape.

Ndị uweojii chụsasịrị igwe mmadụ ndị wakporo otu ebe a na-anabata ndị gbara ọsọ ndụ, ebe ndị ọrụ gọọmenti na-ahazi arịrịọ ọhụrụ maka ịgba ọsọ ize ndụ nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ 'asylum', mgbe mkpebi iwu nke ụlọikpe ukwu nyere n'oge na-adịbeghị anya.

"Esemokwu dara n'etiti ndị mbịarambịa bi na mpaghara ahụ na ụmụafọ South Africa," ka onye uweojii bụ Xolani Fihla gwara ndi ọrụ mgbasa ozi.

Fihla gbakwunyere na ha enwetebeghị ozi mmerụ ahụ ọbụla.

Ndị uweojii kwuru na a gbara ụgbọala 14 ọkụ na Durban nakwa ụgbọala iri ọzọ na Soweto. Ha kwukwara na a gbara egbe n'oge ọgụ dara n'etiti ụmụafọ obodo ahụ na ndị ahịa si mba ọzọ.

Na mpaghara Orlando West nke dị nso na Soweto, ndị bi na ya zukọrọ na mbụ ịrịọ ka e mechie obere ụlọahịa, nke a maara n'ogbe ahụ dịka ụlọahịa 'spaza', nke ndị mbịarambịa na-arụ.

Ndị ngagharịiwe chụpụrụ ndị ahịa si mba ọzọ n'ebe ụfọdụ, ebe a wakporo ụlọahịa ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii kwuru na e zigara ndị ọrụ ha ebe ahụ iji gbochie ọgbaaghara ịmalite ọzọ ebe ndị ọchịchị kwere nkwa ịchọpụta ndị kpatara esemokwu ahụ.