Ihe ị ga-eri ka ahụ gị na-akwọ mụrụmụrụ ka nke nwata

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Melissa Hogenboom
- Ndị mere akụkọ a, Senior Health Correspondent
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Akpụkpọahụ bụ mpaghara ahụ mmadụ kachasị ma bụrụkwa nke kwasịrị ịnọgide oge ndụ anyị niile. Na-agbanyeghị na ọ na-eme ka anyị dịka ndị na-eto eto, e lebara akpụkpọahụ anya nke ọma, ọ ga-ewetere anyị uru na ahụike anyị niile.
Mana dịka ihe mgbochi nke ahụ anyị na elu ụwa, akpụkpọahụ anyị na-ezute ihe izendụ. Ọtụtụ ihe dị na gburugburu so na-eme ka akpụkpọahụ kaa nka, nke gụnyere mmetọ ikuku, 'ozone' na mgbanwe ihu igwe, ka Jean Krutmann, ọkankụzi n'ihe gbasara akpụkpọahụ n'ụlọakwụkwọ Leibniz Research Institute for Environmental Medicine.
"Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị chere na anwụ ọjọọ bụ 'ultraviolet (UV) radiation' kachasị bụrụ ihe si na gburugburu na-eme ka akpụkpọahụ kaa nka, anyị maara na nke a abụghị eziokwu," ka Krutmann kwuru.
'Ultraviolet (UV) radiation' bụ ụdịrị ikike nke si n'anyanwụ.
"Ihe ndị ọzọ sitere n'anyanwụ nwereike ime ka akpụkpọahụ kaa nka, iji maa atụ, ihe nke a na-ahụ anya nkwa nke 'infrared radiation'." Ọbụnadị okpomọkụ ịrị elu nwereike iso bute ya, ka o kwuru.
Mmadụ ịka nka bụkwa ihe ọzọ. Dịka anyị na-aka nka, 'collagen' ejiri nwayọ na-apụ anyị n'ahụ. 'Collagen' bụ akụrụngwa 'protein' nke na-enye akpụkpọahụ ọnọdụ ya ma nyeaka ime ka o sie ike.
Otu ihe a na-eleghara anya nwereike ime ka akpụkpọahụ gị nọrọ n'ezi ọnọdụ bụ ihe anyị na-eri. Site n'abụba ndị mara mma ruo na ụfọdụ nri ndị gbara ụka nwereike inye aka kwalite ahụike nke akpụkpọahụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara ahụike ụmụnwaanyị
1. Mkpụrụosisi na akwụkwọ nri ndị chapụrụ achapụ
O nweela ọtụtụ nchọcha ndị kwuru na nri ndị jupụtara n'ihe si n'osisi dị mkpa maka ime ka akpụkpọahụ ahụ nọrọ n'ezi ahụike.
Ọ dị mkpa ilekwasịanya na mkpụrụosisi na akwụkwọ nri ndị chapụrụ achapụ maka na ha nwere ihe ndị na-egbochi nje siri ike, nke na-enye aka ichekwa akpụkpọahụ na mbibi sitere na mmetọ na anyanwụ.
Karọt, ose na tomato jupụtara na 'carotenoids', tinyere lutein, lycopene, beta-carotene. "A na-echekwa ha n'ebe abụba dị n'ahụ mmadụ, dịka ha na-enye nchekwa megide UV rays," ka Volker Böhm, ọkankụzi gbasara nri na mahadum Friedrich Schiller University Jena kwuru.
Itinye obere abụba ndị mara mma, dịka mmanụ olive n'ime tomato maọbụ karọt na-enye aka ime ka ahụ mmadụ mịkọrọ akụrụngwa ndị na-egbu nje.
N'ikpeazụ, iri ọtụtụ mkpụrụosisi na akwụkwọ nri ndị chapụrụ achapụ bụ nke a chọpụtara na ọ na-eme ka akpụkpọahụ mmadụ gbasie ike ma na-akwọ mụrụmụrụ.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
A chọpụtala na mango na-eme ka akpụkpọahụ anyị dịrị ka nke ụmụaka dịka anyị na-aka nka.
E kwesịrị imekwu nchọcha, mana ndị nchọcha ekwuola na uru dị na ya nwereike ịbụ nke sitere na carotenoid, tinyekwara ihe ndị na-egbu nje bụ flavonoid na mangiferin.
Mango na mkpụrụosisi si n'ezinaụlọ oroma jupụtara na vitamin C. Akụrụngwa Vitamin a na-enye aka imepụta 'collagen' ma na-arụkwa ọrụ dịka ihe na-egbu nje, nke nwereike ichekwa akpụkpọahụ anyị na mmebi si n'anyanwụ.
Nnyocha gosiri na vitamin C nwereike ịkwalite mmiri dị n'akpụkpọahụ ma belata mgbanwe agwa anụahụ. N'ihi nke a, vitamin C bụ ihe a na-eji arụpụta ngwa nlekọta akpụkpọahụ, ka Krutmann kwuru.
2. Abụba ndị mara mma
Ịta ọtụtụ mkpụrụ nwereike inyere akpụkpọahụ anyị aka.
Obere nchọcha e mere chọpụtara na ndị tara mkpụrụ almond izuụka 16 nwere obere mpịakọ ahụ karịa ndị tara mkpụrụ ọzọ.
Vitamin E jupụtara na mkpụrụ ndị a nwekwara ike chekwaa akpụkpọahụ site na mmebi akụrụndụ maọbụ ime ka ọ kaa nka. E nwereike ya na mkpụrụ almond, hazelnuts, pine nut nakwa ọtụtụ mmanụ ndị sitere na mkpụrụ.
Mkpụrụ nwekwara akụrụngwa omega-6 fatty acids, nke nwereike ịkwalite mgbochi nke akpụkpọahụ, iji mee ka ọ ghara ịta mmiri.
Ụdịrị abụba ọzọ dị mma maka akpụkpọahụ anyị bụ omega-3, nke a na-ahụta n'azụ ndị nwere mmanụ nakwa 'algae'.
Azụ ndị jupụtara n'omega 3 gụnyere salmon, sardine na mackerel. Azụ ndị nwere mmanụ na-enye aka ichekwa collagen nke dị adị ma belata ahụ ịza aza.
3. Nri ndị na-abara afọ anyị uru

Ebe foto si, Getty
Ọ bụrụ na anyị rie nri dị iche iche jupụtara na mkpụrụ, nje ọma ndị nọ anyị n'afọ na-erite uru, tinyekwara akpụkpọahụ anyị.
Nke a bụ maka na ahụike nke afọ anyị na akpụkpọahụ nwere ihe jikọtara ha. Ndị nchọcha kọwara ụdị mmekọrịta a dịka "gut-skin axis".
Mgbe ọbụla anyị riri ọtụtụ nri sitere n'osisi, nje ọma ndị nọ n'ime afọ anyị na-emepụta akụrụngwa ndị na-egbochi ọzịza nakwa ihe ndị na-egbu nje. Nke a na-emetụtakwa akpụkpọahụ ahụ, ka Hackman kwuru.
Ọnọdụ ime afọ mara mma nwekwaraike kwalite ọdịdị akpụkpọahụ site n'ịkwado ka ahụ anyị si alụso nje ọgụ.
Nri ndị gbara ụka dịka sauerkraut, kimchi, kombucha maọbụ yoghurt bakwara uru maka inye afọ anyị ihe ha chọrọ.
Ị gaghị adị ka onye gbara afọ 30 ruo ebighịegbi, mana iri erimeri dị mma ga-enye akpụkpọahụ gị ohere ịnọ n'ezi ahụike ruo ọtụtụ afọ na-abịa abịa. Ọ dịkwa mkpa ite mmanụ ndị na-egbochi mmetụta anyanwụ a kpọrọ 'sunscreen'.



























