Kedụ otu egwu bọọlụ ga-ezute ibe ha n'Europe n'izuụka?

Foto na-egosi ndị ọgbaa bọọlụ a ma ama n'otu egwu bọọlụ dị iche iche na mpaghara Europe.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka ọtụtụ ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị n'ebe dị iche iche na-akwado ikiri otu egwu bọọlụ ha na-akwado n'izuụka a, anyị chọrọ itule ụfọdụ asọmpi ndị ahụ ga-akpọtụ akpọtụ n'izuụka a.

A bịa n'asọmpi English Premier League nke mba England, e nwere ọtụtụ asọmpi kpọ ọkụ n'ọnụ bụ nke nwereike ga-akpọtụ n'izuụka.

Ha gụnyere otu bọọlụ Aston Villa ga-anabata Manchester City n'ụlọ ha n'ụbọchị Satọde 24 Ọktoba, 2026.

Mana ebe uche ọtụtụ mmadụ dị bụ n'asọmpi ga-adị n'etiti otu egwu bọọlụ Arsenal na Everton nakwa nke Chelsea na Tottenham Hotspur.

Arsenal ga-anabata Everton n'ama egwuregwu Emirates stadium n'ụbọchị Satọde 24 Ọktoba 2026.

Cheta na Chelsea ji goolu abụọ merie Everton oge ha abụọ zutere onwe ha n'izuụka gara aga.

Chelsea na-atụ anya na otu egwu bọọlụ Tottenham Hotspur ga-abụrụ ha ofe nlacha oge ha ga-anabata ha n'ama egwuregwu ha bụ Stamford Bridge n'ụbọchị Satọde 24 Ọktoba 2026.

N'ụbọchị Sọnde 25 Ọktoba 2026, otu egwu bọọlụ Liverpool na Brighton ga-ama aka n'ama egwuregwu Anfield ebe Manchester United ga-anabata otu egwu bọọlụ Bournemouth n'ụlọ ha bụ Old Trafford dịka ha na-atụanya inweta mmeri ka otu egwu bọọlụ Como 1907 ji goolu anọ ha satara naanị otu sụọ ha akwụ n'asọmpi Champions League ha gbara n'ụbọchị Wenezde 21 Ọktoba 2026.

La Liga

A bịa n'asọmpi La Liga nke mba Spain, ọ bụ asọmpi ga-adị n'etiti otu egwu bọọlụ Barcelona na Real Madrid ka uche onye ọbụla dị na ya.

Nzute a nke ọtụtụ maara dịka 'El Clásico,' bụ nke ọtụtụ mmadụ na-atụanya ya kwa afọ n'ihi na otu egwu bọọlụ abụọ a bụ ndị isi kara aka.

Barcelona ga-anabata Real Madrid n'ama egwuregwu Camp Nou, na-atụanya inweta mmeri n'asọmpi ahụ iji hịchaa onwe ya anya mmiri site na mmeri otu egwu bọọlụ PSG meriri ha n'asọmpi Champions League n'ụbọchị Tuzde 20 Ọktoba, 2026.

Asọmpi ndị ọzọ ga-akpọtụ na La Liga bụkwa nke ga-adị n'etiti otu egwu bọọlụ Atlético Madrid na Deportivo ebe Valencia ga-anabata Villareal n'ụlọ ha.

Serie A

N'asọmpi Serie A nke mba Italy, Napoli ga-ezute Roma, Como ga-ezute Sassuolo n'ụlọ ha dịka ha na-atụanya ime ha ihe ha mere Manchester United n'asọmpi UCL n'ụbọchị Wenezde gara aga.

Inter Milan ga-anabata Fiorentina, ebe Lecce na Juventus ga-achịpụ ya dịka AC Milan ga-aga n'ụlọ Udinese.

German Bundesliga

VfB Stuttgart na Borussia Mönchengladbach ga-achịpụ ya n'ama egwuregwu MHP Arena ebe Mainz ga-anabata SV Werder Bremen.

Augsburg na Union Berlin ga-achipụkwa ya, Paderborn ga-anabata Hamburg, Dortmund ga-ezute Eintracht Frankfurt ebe Hoffenheim na Leverkusen ga-ama aka.

N'aka nke ọzọ, otu egwu bọọlụ Freiburg ga-anabata Bayern Munich dịka FC Köln na FC Schalke 04 ga-ezute n'ụlọ FC Köln.