State Police Bill: Gịnị ga-eme ugbua steeti 24 nabatara atụmatụ uweojii nke steeti?

Femi Gbajabiamila na ndị isi uweojii Nigeria
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu pụrụ iche nke onyeisiala hiwere maka ịhazi Iwu ndị uweojii Nigeria ọhụrụ bụ 'Presidential Working Group' akọwala ihe ga-emezi dịka steei 24 binyere aka ịkwado Nigeria inwe ndị uweojii nke steeti.

Steeti 24 akwadola atụmatụ 'State Police' na Nigeria.

Nigeria nweburu usoro otu uweojii nke bụ Uweojii nke Etiti (Federal Police)bụ ndị na-arụ ọrụ na steeti dị iche iche.

Mana akwụkwọ iwu uweojii ọhụrụ a ghọọ Iwu, a ga-enwe usoro uweojii abụọ; nke Etiti na nke steeti.

N'ozi mgbasaozi nke onyeisi otu 'Presidential Working Group' mabụrụkwa onyeisi ọrụ Onyeisiala bụ Femi Gbajabiamila binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide , o toro nnabata nke steeti 24 nabatara iwu ga-enye ohere ka e hiwe Uweojii nke steeti na Nigeria.

Gbajabiamila kọwara na, dịka mbinye aka nke Ụlọomeiwu steeti 24 binyere n'iwu ahụ mejupụtarala Akụkụ nke Itoolu nke Iwu Nigeria na akwụkwọ iwu ahụ ga-agaghachi n' Ụlọomeiwu nke Etiti bụ ndị ga-ewegara Onyeisiala akwụkwọ iwu ahụ ka o binye ya aka.

Ndị isi ndị uweojii

Ozi ahụ sịrị, "Obi dị otu "Presidential Working Group on the National Policing Bill' ụtọ maka Iwu Mgbanwe nke afọ 2026 (Constitution (Sixth Alteration) Bill, 2026), nke nyere ohere ka e nwee ngalaba uweojii abụọ, nke ụlọomeiwu steeti 24 binyerela aka n'imezu ị nweta nkwado oke abụọ n'ime atọ na steeti 36 dị na Nigeria."

"Otu a na-ekele ndị Ụlọomeiwu nke Stteeti makaihe ha mere na nhazigharịa ndị mkpa ma kelekwa Ụlọomeiwu nke Etiti."

"Dịka ọ dị n'Akụkụ nke Itoolu nke Iwu Nigeria, Iwu Mgbanwe ga-agaghachi n'Ụlọomeiwu nke Etiti bụ ndị ga-ezigara ya Onyeisiala."

Steeti 24 akwadola atụmatụ 'State Police' na Nigeria

Nigeria police officers

Steeti iri abụọ na ise na Nigeria akwadola ka e nwee ndị uweojii nke steeti.

Nke a mezuru ọnụọgụgụ ụzọ abụọ n'ime atọ (2/3) dị mkpa dịka ọ dị n'iwu Nigeria iji hiwe atụmatụ ahụ.

Cheta na ụlọnnochiteanya Nigeria binyere aka n'akwụkwọ Iwu nke steeti n'abalị 10 nke ọnwa Juun, ebe ụlọomeiwu Ukwu binyere ya aka n'abali 24 nke ọnwa Juun ma zigara Ụlọomeiwu nke state 36 dị na Nigeria akwụkwọ ahụ n'abalị 16 nke ọnwa Septemba ka ha binye ya aka na nkwado.

Steeti ndị kwadoro atụmatụ ahụ

Steeti ndị anabatala atụmatụ a gụnyere; Abia, Adamawa, Akwa Ibom, Anambra, Bayelsa, Benue, Cross River, Delta, Edo, Ekiti, Enugu, Gombe, Imo, Kaduna, Kebbi, Kwara, Nasarawa, Ogun, Osun, Oyo, Plateau, Rivers, Taraba, Yobe na Zamfara.

Steeti ndị a na-eche mkpebi ha

Kano State ka na-atule atụmatụ uweojii nke steeti n'ụlọomeiwu ha, ebe Bauchi na Katsina ka na-enyocha ya n'ime kọmitii, dịka a ka na-eche mkpebi Jigawa, Lagos na Niger.

Usoro ime Iwu Uweojii nke Steeti

Usoro ọzọ bụ iziga mkpebi ụlọomeiwu state ndị ahụ n'Ụlọomeiwu Etiti ka e nyochaa ma kwado ha, tupu e zigara Onyeisiala maka nkwado ikpeazụ.

Mịnịstrị ikpe ziri ezi ga-enyocha ma kọwaa ọrụ, ego, na nlekọta ndị uweojii steeti.

N'okpuru atụmatụ a, steeti ọbụla chọrọ inwe ndị uweojii nke ya ga-ebu ụzọ mee iwu ga-ehiwe ha, ma mezuo usoro niile Gọọmentị Etiti hiwere.

A gaghị amalite ọrụ ndị uweojii steeti ruo mgbe e nyochara steeti ahụ ma nye ya asambodo, ebe Gọọmentị Etiti ga-anọgide na-elekọta ha.