Afcon: Caf ekwuola na asọmpi iko mba Africa ga-abụ kwa afọ abụọ ọbụla

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mpaghara Africa a kpọrọ Confederation of African Football (CAF), ekwuola na ha ga-alaghachi n'ịhazi asọmpi iko nke ụmụnwoke Africa bụ Africa Cup of Nations (AFCON) kwa afọ abụọ ọbụla.
Onyeisi otu Caf kpebiri nke a bụ Patrice Motsepe kwuru nke a n'ọgbọka otu Caf nwere na mba Cabo Verde ma kwuo na ha na-elebanye anya ma tulee mgbanwe ị na-ahazi asọmpi Afcon kwa afọ anọ ọbụla ha kpebiri n'afọ gara aga.
O kwuru na ihe mere ha ji malite itule mkpebi a bụ maka asọmpi Africa Nations League Pan-African Competition nke ha chọrọ iji gbanwe Afcon nke a ga na-eme kwa afọ abụọ ọbụla.
O kwukwara na asọmpị ọhụrụ ahụ bụ Africa Nations League ga-enwe ha ọtụtụ afọ ịchịkọba tinyekwara enweghị ego nakwa nkwado iji mee ka asọmpi egwuregwu Caf ọbụla bụrụ ọkaibe n'ụwa.
O mere ka o doo anya na ebumnobi Caf bụ ịkwalite asọmpị bọọlụ, chekwaa ya ma mee ka mba 53 n'esonye n'asọmpi Caf ọbụla nwee mmasị na ezi ntụkwasịobi na ha.
O kwuru na asọmpi Afcon ọzọ a ga-eme bụ na mba Kenya, Tanzania nakwa Uganda n'afọ 2027.
Motsepe kwuru na ya nwere ntụkwasịobi na mba atọ a ga-ahazi ezi egwuregwu Afcon ahụ.































