Israel election results live: Mpụtara ntuliaka na-ekwu na enwebeghị onye meriri

Ebe foto si, Getty Images
Mpụtara si na ntuliaka mba Israel na-ekwu na ka ọ dị ugbua, enwebeghị onye nwetara mmeri na ntuliaka e mere na mba ahụ.
Cheta na ntuliaka a bụ Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu na Gadi Eisenkot bụbu onyeisi ndịagha mba Israel zọrọ ntuliaka ahụ.
Ozi ụlọọrụ mgbasaozi abụọ n'Israel wepụtara na-ekwu na pati Eisenkot bụ Yashar party na pati ndị Jew atọ ndị ọzọ ya na ha na-enwe mmekọ ga-enweta mmeri n'oche 51 n'ime oche 12 Knesset ha na-azọ. Ha kwuru na ọ bụkwa etu ka ọ dịịrị Netanyahu na pati ya.
E kwuru na ọtụtụ mmadụ pụtara n'igwe bịa tụọ vootu na ntuliaka.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka n'israel bụ Central Elections Committee, kwuru na oge a mesịrị ntuliaka n'elekere iri nke abalị n'israel, ndị bịara tụọ vootu ruru pasenti 77. A chọpụtakwara na nke bụ nke kacahsị kemgbe afọ 1999.
Ha kwuru na a ga-amalite iwepụta mpụtara ntuliaka n'abalị, mana vootu dị 600,000 nke ndịagha tụrụ nke bụ pasenti 10 n'ime vootu niile a tụrụ, bụ n'ụbọchị Tọzde ka a ga-amalite ịkpọpụta ya.
Ngwa ngwa e kwuru onye meriri na ntuliaka a ma hụ na pati niile nabatara mpụtara ahụ, onyeisiala mba Israel ga-akpọ ndịisi pati meriri ntuliaka ahụ iji hụ na a haziri gọọmenti – nke nwereike inwe ọtụtụ izuụka.
Mana ọ bụrụ na ha enweghị ike ịhazi gọọmenti ọhụrụ, nke a pụtara na a ga-eme ntuliaka ọzọ.
Ndị nkwado pati Eisenkot bụ Yashar party nọ n'isiụlọọrụ pati ha dị na Tel Aviv, na-akpọ oku ma na-eti mkpu "Bibi, lawa ụlọ gị!" oge ụlọọrụ mgbasaozi Kan, Channel 12 na Channel 13 wepụtara ozi na pati Eisenkot nwereike inweta mmeri na Knesset.
Eisenkot kwuru na pati emeela ihe na-emetubeghị na mbụ ma kwe nkwa ọ bụ naanị ihe ga-enweta ọdịmma ndị obodo bụ ihe gọọmenti ga-eme.
N'aka nke ọzọ, ozi na-ekwu na pati Netanyahu bụ Likud party adịghị njikere ịda mba na Jerusalem ebe e kwuru na ha ka nwee ndị omeiwu n'ụlọomeiwu Israel.
Mana ndị nkwado ya n'ebe ahụ gwara BBC na obi koro ha n'elu. Otu onye aha ya bụ Itzik kwuru na oke ekpomọkụ na-eme mana o nwere okwukwe.
Netanyahu gwara ndị nkwado ya n'isiụlọọrụ Likud party na ha na-enwe mmeri.
Ntuliaka a e mere n'ụbọchị Tuzde 27 Ọktoba 2026, bụ nke mbụ a na-eme kemgbe mwakpo Hamas wakporo mba Israel n'Ọktoba 7 2023 nke butere agha na Gaza, Lebanon nakwa Iran.
Ụmụafọ Israel hụtara ya dịka ntuliaka dị oke mkpa n'ihi na ọ ga-eme ihe abụọ - nke mbụ bụ ma o nwereike ịgbanwe ọchịchị, nke abụọ bụ ime ka ndị Israel mara ka ha a ga-aganihu n'oke ahụhụ nakwa nsogbu okpukperechi ha na-agabiga kemgbe.
Ụfọdụ nkwa pati abụọ a kwere oge ha na-achụnta vootu bụ ihiwe ezi usoro nchekwa nke ha kwuru na ọ bụ ya kpatara mwakpo ahụ mere n'Ọktoba 7, etu ha ga-esi gaa ọgụ, etu ha ga-esi hazie ọrụ ndịagha, ịgbanwe ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe nakwa ịkwalite etu mba ndị ọzọ si ahụta Israel.
Otu nwaanyị aha ya Zivit Abramson gbara afọ 88, gwara BBC na ọ bụ Eisenkot ka o binyere aka n'ihi na Netanyahu na-emebi mba Isreal. O kwuru na ọ bụ naanị ọchịchọ onwe ya ka ọ chọrọ, ọdịmma ndị mba Israel adịghị ya n'obi.
Otu nwaanyị ọzọ aha ya bụ Claire Tugendhaft kwuru na ihe mere o jiri tụọrọ Netanyahu vootu ya bụ maka na o kwenyere na ọ bụ naanị nwereike ịchị mba Israel nke ọma.

























