Gọvanọ Hope Uzodimma ka ji ọkọlọtọ anyị azọ ọkwa sinetị – Imo APC

Gọvanọ Imo state bụ Hope Uzodimma na Rochas Okorocha bụbu gọvanọ Imo state.
Nkọwa foto, Gọvanọ Hope Uzodimma na Rochas Okorocha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) ngalaba Imo state ekwuola na ọ bụ Gọvanọ Hope Ụzodimma ka ga-eji ọkọlọtọ pati ha azọ ọkwa Sinetị ga-anọchiteanya mpaghara Imo-West.

Otu APC mere ka a mata nke a n'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Onwuasoanya FCC Jones wepụtara na mgbede ụbọchị Tọzde 29 Ọktoba 2026 ma kesaa n'akara soshal midịa ha.

Dika ozi ahụ si kwuo "APC maara maka akụkọ na-efegharị na soshal midịa bụ nke na-ekwu na ụlọikpe agbanweela onye ga-eji ọkọlọtọ pati ya azọ ọkwa sinetị ga-anọchiteanya mpaghara Imo-West".

Ha gara n'ihu kwuo na "APC chọrọ ikwu hoohaa na Gọvanọ Hope Uzodimma bụ onye ji ọkọlọtọ pati ha azọ ọkwa sinetị ga-anọchiteanya mpaghara Imo-West maka na o meriri nkeọma na ntuliaka imeụlọ anyị mere iji họpụta ọnye ga-azọ ọkwa nnọchiteanya mpaghara ahụ."

"Ngalaba na-ahụ maka iwu na pati anyị ga-atụle mpụtara mkpebi ụlọikpe nyere maka nke a na nsonso a ma mee ihe ha kwesịrị ime".

Mkpebi ụlọikpe maka onye ga-azọrọ APC ọkwa Senetị n'Imo west

Hope Uzodimma

Ụlọikpe nke Etiti dị n'Abuja enyere ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ Independent national electoral commission, Inec ntuziaka ka ha bipụta aha aka chịbụrụ Imo steeti bụ Rochas Okorocha dịka onye meriri na ntuliaka imeụlọ nke otu APC mere maka ọkwa onye ga-anọchite Imo-West n'Ụlọọmeiwu Ukwu Nigeria.

Ụlọikpe nyere iwu ahụ n'ụtụtụ Tozde, ma nyekwa iwu ka aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwụsị ịkpọ onwe ya onye ga-anọchiteanya mpaghara Imo west na Ntuliaka afọ 2027.

Akara ikpe ahụ bụ FHC/ABJ/CS/1854/2026.

Ọ bụ akwụkwọ Okorocha gbara megide ụlọọrụ na ahazi ntuliaka bụ Inec, APC nakwa Uzodimma.

Okorocha gbara akwụkwọ ahụ maka na Inec bipụtara aha Uzodimma dịka onye ga-eji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa inochiteanya mpaghara Imo-West n'Ụlọọmeiwu Ukwu na ntuliaka 2027.

Rochas Okorocha

Ọkaikpe na n'isi ikpe ahụ bụ Jọstịs Egwuatu kwuru na ihe akaebe gosiri na ọ bụ Okorocha nwetara vootu kachasị na ntuliaka imeụlọ nke pati ha bụ APC mere maka ọkwa senetọ ga-anọchite mpaghara ahụ.

N'ihe onyonyo o wepụtara na soshal midia n'ogige ụlọikpe, ọkaiwu na-anọchịte Okorocha kwuru na "Anyị sị n'ụlọikpe pụta ugbua, ụlọikpe enyochaala ma nye Inec iwu ka ha, ozigbo ozigbo bipụta aha Rocha Okorocha dịka Senetọ ga-anọchite Imo West na ntuliaka ."

"Ọ bụ ya meriri na ntuliaka (Imeụlọ APC ) mana APC weghara Inec aha onye emerighị na ntuliaka."

Rochas Okorocha na Hope Uzodimma