A gbaala ọtụtụ ụgbọala na ụlọahịa ọkụ na South Africa

Aha onyonyo, Xenophobia: A gbaala ọtụtụ ụgbọala na ụlọahịa ọkụ na South Africa
A gbaala ọtụtụ ụgbọala na ụlọahịa ọkụ na South Africa
Mgbe e biputara ya

Mkpesa na ngagharịiwe esubirila ọzọ na mpaghara ụfọdụ na mba South Africa n'ihi mbata nakwa obibi ndị mbịarambịa na-enweghị akwụkwọ ikike nke iwu kwadoro.

E merụọla ọtụtụ mmadụ ahụ, kpọọ ụgbọala iri ọkụ na mpaghara Soweto na Durban, ebe akụkọ kwuru na ndị ngagharịiwe a lekwasịrị anya n'ụlọahịa ndị mbịarambịa.

Dịka ndị bi n'ebe ahụ siri kwuo, ngagharịiwe nke malitere n'udo n'Orlando West dị na Soweto, nke e ji akpọ oku ka e mechie obere azụmahịa ndị mbịarambịa nwee, ghọrọ ihe ike mgbe e kwuru na ndị ngagharịiwe ahụ nwetara mgbọ site n'aka ụfọdụ mmadụ.

Na Durban, ọgbaaghara ejupụtala ebe niile dịka a na-akpọ ụgbọala ọkụ ma na-akwakọrọ ngwahịa ndị mbịarambịa.

Ndị uweojii South Africa kwuru na ha ejidela ndị mbịarambịa atọ maka ebubo na ha wakporo otu onye na-eme ngagharịiwe.

Ka ọ dị anyị anụkwala na e mere ngagharịiwe yiri nke a na Cape Town nakwa na mpaghara Eastern Cape, mana ndị uweojii chụsasịrị igwe mmadụ ndị wakporo otu ebe a na-anabata ndị gbara ọsọ ndụ.

Xolani Fihla bụ onye uweojii mba South Africa gwara ndị ntaakụkọ na a gbara ụgbọala 14 ọkụ na Durban, gbaakwa ụgbọala iri ọzọ ọkụ na Soweto, ma kwuokwa na a gbara egbe aghara aghara n'oge ọgụ dara n'etiti ụmụafọ mba ahụ na ndị si mba ọzọ na-azụ ahịa.