Ahapụrụ m ụlọ nna m n'Aba gaa Lagos iji bụrụ onye na-eme ejije - Ruby Akubueze

Aha onyonyo, Ahapụrụ m ụlọ nna m n'Aba gaa Lagos iji bụrụ onye na-eme ejije - Ruby Akubueze
Ahapụrụ m ụlọ nna m n'Aba gaa Lagos iji bụrụ onye na-eme ejije - Ruby Akubueze
Mgbe e biputara ya

Ruby Akubueze bụ nwaada Igbo na-eme ejije a ma ama na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka ebe ọ nọ kọwaara anyị etu njem ya dịka onye na-eme ejije si malite nakwa etu o si hapụ ụlọ nna ya n'Aba, Abia state bịa Lagos oge ọ dị naanị afọ 18 iji chụọ akaraaka ya dịka onye na-eme ejije tinyere etu ndị mmadụ si mekpaa ya ahụ oge ọ na-eto dịka nwatakịrị maka ụdịrị ahụ o nwere.

"MTV Shuga bụ ejije mbụ m mere n'afọ 2017. Ọ bụ ejije kachasị a na-egosi na TV oge ahụ. Ana m ekiri MTV Shuga oge m ka bi n'ụlọ nna m n'Aba. Ya bụ na i mecha soro na ndị ejije na-eme ya bụ ihe obi ụtọ nye m. E kiriri m Sound of Music, m gwa onwe m na a chọrọ ịbụ onye na-eme ụdịrị ihe a. Amaara m na ọ bụ ịkpa obi aṅụrị ka e deere m. Oge m dị afọ 13, esonyere m otu na-eme ihe nkiri n'ụlọụka anyị ruo 2017 oge m hapụrụ Aba, Abia state bịa Lagos iji malite ime ejije dịka ọrụ m," ka o kwuru.

Ruby kọwara ihe mere ya na nna ya ji kwụsị ikwu okwu oge ahụ ọ hapụrụ ụlọ ha n'Aba gaa Lagos.

"O nyeghị obi ụtọ maka na abụ m nwaanyị ma bụrụkwa nwatakịrị oge ahụ. Adị m afọ 18 oge ahụ ma chọọ ịbịa hapụ ụlọ gawa n'obodo ọzọ ị na-amaghị mmadụ ọbụla. I nweghị enyi maọbụ ezinaụlọ ebe ahụ. Amaara m na ọ bụghị ihe obi ụtọ mana aga m eme ya. Aga m eme ya maka na ama m ebe m na-aga. Ama m etu nne na nna m si zụọ m. N'agbanyeghị ihe ọbụla mere, ama m na unu azụọla ezigbo nwaanyị."

Ruby Akubueze gara n'ihu kwuo ihe mere o ji jiri ohere ya akpọ oku megide mkpagba n'ụdị ọbụla.

"Oge m na-eto, enwere ụdịrị ahụ ndị bekee kpọrọ unique. Enwere m ahụ dị unique. Ọtụtụ ndị mụ na ha toro buru ibu n'ebe m nọ. E mekpara m ahụ ọtụtụ oge maka etu m ha dịka nwata. Oge ohere m malitere ịmụbawaye, amaara m na ọ dị mkpa ka m jiri ohere a m nwere kwuoro ndị na-enweghịike ịlụrụ onwe ha ọgụ maka na anọọla m n'ụdịrị ọnọdụ ahụ, amaara etu ọ si adị."

Ruby Akubueze bụ onye ritere onyinye Africa Movie Academy Awards dịka Best Young/Promising Actor nke afọ 2025 kọwaara anyị etu obi dị ya oge o ritere onyinye ahụ ma kọwakwaa ihe ndị ọzọ ndị nkwado ya ga-atụanya n'aka ya.