Gịnị ka Popu Leo ga-eme na njem mbụ ya n'Afrịka?
Onyeisi Ụka Katọlik na mba n'ụwa niile bụ Popu Leo XIV, ga-eme njem na mba anọ dị n'Afrịka malite n'ụbọchị abalị iri na atọ nke ọnwa Eprel, 2026.
Vatịkan kwuru na mba ndị ahụ Popu Leo ga-aga gụnyere Kameruun, Angola Ọljirịa na Equatorial Gini.
Ozi Vatịkan wepụtara kwuru na njem a bụ iji mee ka mbaụwa mara ihe na-eme n'Afrịka ma kwuo na e nwere ndị ụka Katọlik ruru nde iri abụọ n'Afrịka nke gosiri na ndị ụka Katọlik na-amụbawanye n'Afrịka.
Mba mbụ Pope Leo ga-aga na njem a bụ mba Ọljirịa bụ ebe a mụrụ Saint Augustine, onye e ji ntọala ya hiwe Augustinian Order nke Popu Leo so na ya.
Ọ ga-aga n'ụlọụka Alakụba Great Mosque of Algiers iji kpọọ oku ịdị n'otu n'agbanyeghị okpukperechi na nkwenye onye.
Nke a bụ oge mbụ onyeisi ụka Katọlik ọbụla ga-eme njem na mba Ọljirịa.
Popu Leo kwuru na ọ bụ oziọma udo na ịdị n'otu ka o nwere inye ndị mba ahụ nwere ndị ụka Katọlik bụ pasenti iri anọ n'ọnụọgụgụ ụmụafọ mba ahụ.
Cheta na ndị ojiegbe na-eyi ọha egwu na-akpa mkpa na mba Kameruun kemgbe ihe ruru afọ iri.
Otu UN kwuru na mwakpo ndị ahụ egbuola mmadụ puku isii ebe mmadụ puku narị ise ahapụla ụlọ ha iji zọọ ndụ ha.
Popu Leo ga-aga Bamenda bụ isiobodo mpaghara ugwu mba Kameruun ma bụrụkwa ebe mwakpo ahụ kacha eme.
Popu Leo ga-esi mba Kamerrun gaa Angola tupu ọ ga mba Ekwitorial Gini.
Vatikan kwuru na mba abụọ a nwere ọtụtụ ọnụọgụgụ ndị Ụka Katọlik.
Njem a bụ njem mbụ Popu Leo na-eme n'Afrịka kemgbe a họpụtara ya dịka Onyeisi ụka Katọlik na Mee 2025.
Popu ndị ọzọ mere njem n'Afrịka n'oge gara
Popu Ụka Katọlik emeela njem na mba dị iche iche n'Afrịka n'oge gara.
- Popu Paul VI, gara mba Yuganda n'afọ 1969 ma bụrụ Popu mbụ bịara Afrịka dịka onyeisi ụka Katọlik.
- Popu John Paul II, mere njem na mba iri anọ na otu n'Afrịka n'ime afọ 1980 ruo 1998 n'ime afọ iri abụọ na isii ọ ji ọkwa dịka onyeisi Ụka Katọlik.
- Ọ bụ ya bụ Popu kachasị mee njem n'Afrịka.
- Popu Benedict XVI, gara mba Kameruun na Angola n'afọ 2009 ma ga mba Benin n'afọ 2011.
- Popu Francis, mere njem na mba iri n'Afrịka n'ime afọ 2015 ruo 2023.



