Etu mmanwụ Oriọkpa, Akatakpa na Omabe si akpazị ike ọjọọ na Nsụka

Aha onyonyo, Etu mmanwụ Oriokpa, Akatakpa na Omabe si akpazị ike ọjọọ na Nsụka
Etu mmanwụ Oriọkpa, Akatakpa na Omabe si akpazị ike ọjọọ na Nsụka
Mgbe e biputara ya

Ajụjụ wee bụrụ, Kedụ uru mmanwụ bara, ma ọ bụrụ na ndị n’eme ya ji mmanwụ ahụ eti mmadụ ihe, anapụ mmadụ ihe n’ike ma n’egbukwa mmadụ?

Na Nsukka mmanwụ ndịa ka a na-aya, Oriokpa, Akatakpa na Omabe.

Mmanwu ndị ahụ n’ejuputa n’ụzọ niile, na-achụ ma ụmụ nwoke , ma ụmụ nwaanyị ọsọ, n’eti ndị mmadụ osisi na mma, mmanwụ ahụ ebutekwala ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

Ihe onyonyo nọ na soshal midia gosiri ebe mmanwu Oriokpa tiri otu nwoke ihe meruru ya ahụ, nwoke ahụ na ndị enyi ya lusowara mmanwụ ahụ ọgụ ma kpupu ihu ya.

Ọzọkwa mere n'ogige Odenigbo Nsukka ebe otu nwoke ji ahụ ụfụ ihe mmanwụ ahụ tiri ya chụwa ya ọsọ ma luso ya ọgụ.

Mana ụmụ nwaanyi ndị enweghi ike ịluso ha ọgụ na atụ egwu ịpụta ezi.

Cheta na afọ 2024 ka mmanwụ oriokpa tiri nwaanyị nọsụ Blessing Ogbonna ihe tukpuo ya na okporo mmiri gọta n'Ihe-Owerre Nsukka. Nkea mere ndị Omeiwu Enugwu jiri kpaa ka a ga-esi kwụsị ndị omekome ahụ jizi mmanwụ akpa ike.

Anyị wetakwara akụkọ izu ụka abụọ gara aga na BBC Igbo ka nwaanyi siri kpupu ihu mmanwụ Omabe n’eti ya ihe na uhunowerre di na igboetiti, wee chọpọta na ọ bụ di ya nọ na mmanwụ ahụ.

Kedụ ka a ga-esi kwọọ onye ukwu wara?

Oriakụ Beneditta Ogbodo n’arụ ọrụ na ụlọ akwụkwọ mahadum Nsukka kwuru na egwu na atụ ha maka ụdị ịtarị mmanwụ oruokpa na-akụ mmadụ. Okwuru na mmanwụ ahụ chụụrụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọsọ bata n’ụlọ ya ma tie ya ihe.

Nwoke ọzọ bụ onye Eha Alụmọna Francis Omeke kwara arịrị na mmanwụ Omabe na be ha bụzị ndị otu nzuzo ji ya akpa ike. Ọ kwara arịrị na ha jizi mmanwụ ahụ ezu ohi, ama aka n’akpa ma na emeru mmadụ ahụ.

Kọmitte Gọmenti guzobere mgbe gara aga mechara machie mmanwụ ahụ otu afọ, ka otu afọ gachara ha gara n’ihu n’eme nke ka njọ.

Ụlọ omeiwu Enugwu etinyekwala ya bụ okwu ọnụ.

Kedụ ihe ichere bụ ihe ekwesiri ime maka mkpa mkpa mmanwụ Oriokpa, Akatakpa na Omabe na-akpa na Nsukka.