Ihe i kwesịrị ịma gbasara ọrịa apa afọ na-egbu ụmụaka

Aha onyonyo, Ihe i kwesịrị ịma gbasara ọrịa apa afọ na-egbu ụmụaka
Ihe i kwesịrị ịma gbasara ọrịa apa afọ na-egbu ụmụaka
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Apa afọ bụ otu ọrịa a ma ama na-egbu ụmụaka nakwa ndị na-eto eto site n'ịmị ha ọbara n'ahụ na ime ka afọ ha buo ibu.

Mana otu ihe mere ka ọrịa a pụọ iche bụ nkwenye ụfọdụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị nne na nna na ndị ọdịnaala nwere gbasara ya.

Ọtụtụ ndị nne na nna kwenyere na ọ bụ naanị dibịa mgbọrọgwụ nwereike ịgwọ apa afọ. Ha sị na anaghị agwọ ya n'ụlọọgwụ.

Ọnọdụ a mere BBC News Igbo ji kpọtụrụ otu onye dibịa mgbọrọgwụ na-agwọ ọrịa apa afọ n'Ubommiri dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Mbaitoli n'Imo Steeti, tinyekwara dọkịta ụmụaka na-arụ n'ụlọọgwụ Federal University Teaching Hospital Owerri nakwa ụfọdụ ndị nne na nna iji mara ihe ha chere gbasara ọrịa apa afọ.

Oge ọ na-akọwara anyị ihe ọrịa apa afọ pụtara, Eric Nwokeforo bụ dibịa mgbọrọgwụ kọwara na ọrịa ahụ na-emetụta akụkụ ahụ a kpọrọ 'spleen' ebe ihe na-akpalite ya bụ ahụọkụ.

Nwokefọrọ sịrị: "Ọ na-anọ n'akụkụ abụọ, o nwere nke na-anọ n'aka nri, nweekwa nke na-anọ n'aka ekpe. Ọtụtụ n'ime ndị nke nọ n'aka ekpe bụ apa isi obi n'ihi na obi mmadụ nọ n'aka ekpe. Ọ bụrụ na gị pịa ya aka, ị ga-achọpụta, ọ na-afụlite afụlite n'afọ".

"Ọ na-egbu mmadụ maka na o bido mewe nnukwu ahụọkụ, ọ malite ịmị ọbara. Ọ bụrụ na ọ na-amị ọbara, ọ na-ebu. Ọ bụrụ na a kwụsịghị ya, ọ ga-aga n'ihu na-amị onye ahụ ọbara, onye ọbara na-anọghị n'ahụ anwụọla."

Nwokefọrọ sịrị na ụzọ o si agwọ ụmụaka ọrịa apa afọ bụ site n'ite ha ọgwụ n'afọ ma were ụkwụ zọrịa ya iji na-agbasa apa afọ ahụ.

"Ọ bụrụ na a zọchaa ha ụkwụ n'afọ, a gbabanye ha ọgwụ n'afọ ka ha nwee ike nyụpụ ya. Ọgwụ anyị na-enye bụ naanị mkpụrụ ụbọchị anọ, n'ime ụbọchị anọ ihe niile adịla mma," ka ọ kọwara.

Ụfọdụ ndị nne na nna anyị jụrụ ajụjụ gbara akaebe na ọgwụ dibịa mgbọrọgwụ ahụ na-arụ ọrụ nke ọma n'ihi na ọ gwọọla ụmụ ha apa afọ tinyekwraa ụmụaka ndị ọzọ ha maara.

Otu onye nne aha ya bụ Chinwendu Echetama sịrị na ya akpọrola nwa ya gaa n'ụlọọgwụ, a gbachaa ya ọgwụ mana o nweghị ihe nwere isi, nke mere o ji kpọrọ ya bịa n'ụlọ dibịa mgbọrọgwụ ahụ.

"Ọ bụ chi fotere ụnyaahụ ka mụ na nwa m lọtara ụlọọgwụ. Ha gbachara ya ọgwụ niile ha gbara ya, mana o nweghị ihe m hụrụ. Ọ rahụ ụra n'abalị, ahụọkụ akarịa, afọ ya na-ebu ibu. M sịzie ka m kpọrọ ya bịa ebe a".

Chinwendu Echetama kwuru na dibịa mgbọrọgwụ ahụ agwọọla ụmụ ya ndị ọzọ ọrịa apa afọ n'oge gara aga, ma kọwaa na dibịa ahụ na-enyocha ụmụaka nke ọma iji mara ma ọ bụ apa afọ ma ọ bụkwanụ ọrịa ọzọ na-enye ha nsogbu.

"Ya bụrụ na ọ bụghị apa, ha ga-agwa gị na ọ bụghị ya. Ọ bụrụkwanụ ya, ha emee ya," ka Chinwendu Echetama gwara anyị.

Oge ọ na-enye nkọwa nke ya, Dọkịta Chidiuto Oparaji kwuru na ha na-ahụta apa afọ dịka ọrịa ụmụaka nke na-eme ka afọ ha maọbụ 'spleen' ha buo ibu.

Dọkịta Oparaji kọwara na ọrụ 'spleen' bụ iwepụ ọbara ọjọọ, nke na-ebukwa ibu ma o wepụchaa ọbara ọjọọ ndị ahụ.

Ọ sịrị na ihe ha na-eme dịka ndị dọkịta bụ inye ọgwụ iji gwọọ ọrịa ahụ na-eme ka 'spleen' buo ibu.

"Nwata ọbụla nwere ya na-enwe ahụọkụ maọbụ na-acha mmiri mmiri dịka onye na-enweghị ọbara n'ahụ, maọbụ na-agba agbọọ maọbụ na-anyụ anyụ".

"Ịhụ ka nwata na-anwụ na-afụ anyị ụfụ. Ọ bụrụ na ị kpọrọ nwa gị gaa n'ebe a na-eme ya, ma ahụ adịghị ya mma n'ime ụbọchị abụọ, biko kpọrọ ya gaa ụlọọgwụ," bụ ndụmọdụ Dọkịta Chidiuto Oparaji nyere ndị nne na nna nakwa ndị nlekọta ụmụaka.