Gọọmenti Naịjirịa ga-amalite ịkpọlata ụmụafọ bi na Saụt Afrịka

Aha onyonyo, Gọọmenti Naịjirịa ga-amalite ịkpọlata ụmụafọ bi na Saụt Afrịka
Gọọmenti Naịjirịa ga-amalite ịkpọlata ụmụafọ bi na Saụt Afrịka

Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha amalitela atụmatụ ịkpọlata ndị Naịjirịa nọ na mba Saụt Afrịka chọrọ ịlaghachite Naịjirịa dịka a na-ekwu na mwakpo xenophobia e mere megide ndị mbịarambịa nwereike ịkawanye njọ.

Mịnịsta Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Bianca Ojukwu, kwuru na mmadụ otu narị na iri atọ edebanyela aha ha na ndị chọrọ ịlaghachite Naịjirịa ma kwuo na Onyeisiala Bola Tinubu akatọọla mwakpo ahụ ndị mba Saụt Afrịka na-awakpo ndị si mba Afrịka ndị ọzọ.

Mana oge anyị kpọtụrụ odeakwụkwọ otu Igbo Union South Africa bụ onye Ezeanozie Eneberi, o toro atụmatụ ahụ gọọmenti Naịjirịa chepụtara banyere ịkpọghachita ụmụafọ Naịjirịa chọrọ ịhapụ Saụt Afrịka.

O tokwara Ninikanwa Okey-Uche ji ọkwa Consul General Naịjirịa na mba Saụt Afrịka maka ọrụ ọ na-arụ iji hụ maka nchekwa ndụ ụmụafọ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka.

Ọ gara n'ihu gwa anyị na ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ekwuputala ebumnobi ha ịlaghachite Naịjirịa maka mkpagbu nakwa mmekpa ahụ ha na-enweta n'aka ndị Saụt Afrịka.

Eneberi mere ka o doo anya na ọ bụghị naanị mmadụ otu narị na iri atọ debnayere aha na ndị chọrọ ịhapụ mba Saụt Afrịka ma laghachite Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka e gburu ụmụafọ Naịjirịa abụọ na mwakpo xenophobia ahụ na mba Saụt Afrịka ebe akụkọ kwuru na e gbukwara ndị mba Itiopịa anọ na mwakpo ahụ.

Mwakpo xenophobic abụrụla ihe na-eme na mba Saụt Afrịka kemgbe ọtụtụ afọ ma butekwa ọnwụ ọtụtụ ụmụafọ mba Afrịka dị iche iche, mmebi ọtụtụ ụlọazụmahịa, ụlọ, ụgbọala nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.