Ihe mere e ji eme emume ncheta Bịafra n'ụbọchị 30 Mee
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Bịafra bụ aha ndị si na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa họorọ ịkpọ onwe ha mgbe ha na-azọ nnwereonwe ha n'afọ 1966.
Ụwa malitere ịnụ maka Bịafra mgbe Ọchịagha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu kwupụtara na ya chọrọ ka ndị nke ya kwụụrụ onwe ha ma nwere onwe ha. Nke a kpasuru ndị ndu Naịjirịa iwe, nke mere Ọchịagha Yakubu Gowon jiri foro ntutu taa sị na Naịjirịa ga-abụrịrị otu.
Okwu a abụghị okwu nkịtị maka na ọ tara isi mmadụ, tụmadị ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ n'oge ahụ.
Mpaghara Bịafra gụnyere ndị Igbo, ndị Ijọ, Efik, Ibibio nakwa agbụrụ ndị ọzọ.
Dịka ọtụtụ n'ime anyị maara, Naịjirịa nweere onwe ya n'aka ọchịchị mba United Kingdom n'afọ 1960, mana tupu nke ahụ e nwee isi, a nọrọlarị na-enwe esemokwu n'etiti agbụrụ dị iche iche, ọbụnadị mgbe a na-akpa maka nnwereonwe Naịjirịa. Ọmụmaatụ bụ ọgbaaghara mere na Jọs n'afọ 1945, oge ndị Awụsa na Fụlanị busoro ndị Igbo agha ma gbuo opekatampe mmadụ abụọ. Ụdịrị ya mekwara ọzọ na Kano n'afọ 1953.
N'ọnwa Jenụwarị 1966, ọnọdụ a tọpụrụ ọgọdọ ma gbarazie ọtọ dịka ndịagha kwaturu ọchịchị ma gbuo ndị ndu 30 gụnyere Praịm Minista Naịjirịa n'oge ahụ bụ Abubakar Tafawa Balewa, Onyendu ndị ugwu bụ Ahmadu Bello nakwa ndị ugwu anọ ọkwa ha dị elu. Nke a mere Ọchịagha Aguiyi Ironsi ji weghara ọchịchị iji weta udo.
N'ọnwa Julaị 1966, ndịagha si mpaghara ugwu mere nkwatu ọchịchị nke ha, gbuo Aguiyi Ironsi nakwa ụfọdụ ndịagha si mpaghara ndịda ma kwupụta Ọchịagha Yakubu Gowon dịka Onyeisi Gọọmenti Ndịagha Etiti. N'ọnwa Septemba 1966, e gburu ndị Igbo ruru 30,000 ma merụọ puku kwuru puku ndị ọzọ ahụ, napụkwa ha ngwongwo ha, nke mere ka ha rie mbọmbọ na mpaghara ugwu. N'otu aka ahụ kwa, ndị Igbo chụlara ndị ugwu bi n'Ọwụwa Anyanwụ.
N'ọnwa Jenụwarị 1967, Yakubu Gowon, Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu nakwa ndị uweojii ọkwa ha dị elu si mpaghara dị iche iche zutere n'Aburi dị na mba Gana ma kwekọrịta ịhụ na e kesara ọchịchị n'etiti agbụrụ dị iche iche, bụ nke a maara dịka 'Aburi Accords'. Ọ bụ eziokwu na ndị Ugwu gbara ụkwụ megide atụmatụ a, mana Obafemi Awolowo bụ Onyendu mpghara Ọdịda Anyanwụ dọrọ aka na ntị na ọ bụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ onwe ha na Naịjirịa, na mpaghara Ọdịda Anyanwụ ga-emekwa etu ahụ. Ọ bụ nke a mere ndị Ugwu jiri nabata nkwekọrịta 'Aburi Accords'.
Mana, oge ha lọghachiri Naịjirịa, Gọọmenti Etiti gharịpụrụ na nkwekọrịta ha nwere, kama ha gara n'ihu kwupụta maka nkepụta steeti ọhụrụ, ma kpapụ mpaghara Igbo n'akụkụ. Ọ bụ nke a mere Ojukwu jiri mee nkwupụta n'ụbọchị 30 Mee 1967 na ya ekewapụla onwe ya, ma ka ụbọchị anọ gasịrị, o kwupụtara nnwereonwe mba Bịafra kwụụrụ onwe ya.
Nke a bụ mmalite nkwafu ọbara na Naịjirịa, dịka ndịagha Naịjirịa busoro ndịagha Bịafra agha site n'ụbọchị 30 Mee 1967 ruo n'ụbọchị 15 Jenụwarị 1970.
Ka ọ dị, amaghị kpọmkwem mmadụ ole nwụrụ n'akụkụ ndị Naịjirịa nakwa n'akụkụ ndị Bịafra.
Ọ bụ nke a mere e ji echeta Bịafra n'ụbọchị 30 Mee afọ ọbụla.



