Etu e siri katọọ Alex Otti maka ọdọụgbọala ọ kpọrọ aha Nnenna Oti n'Ụmụahịa
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Kemgbe aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti gbapechara ọdọụgbọala ukwu dị n'Ụmụahịa n'ụbọchị 27 Mee 2027, ma gụọ ya aha Nnenna Oti bụ Ọkankụzi kpọpụtara ntuliaka e ji họpụta Alex Otti n'ọkwa, ebe niile ebirila ọkụ dịka ọtụtụ mmadụ kpụ aha ya n'ọnụ, ụfọdụ na-ekwu mma, ebe ụfọdụ na-ekwu njọ.
N'oge ha na-ekwu okwu, otu ndọrọndọrọ ọchịchị All progressives Congress n'Abịa Steeti sịrị tụfịakwa, na nke a bụ nnọọ ka ọ dịkwa ka a na-eme. Odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Uche Aguoru kọwara ya dịka inye nkwado na-enweghị isi na ọdụ ma bụrụkwa ọnọdụ nwereike ịkụsasị ntụkwasaobi ụmụ mmadụ n'usoro ntuliaka Naịjirịa.
Aguoru sịrị na Nnenna Oti rụrụ ọrụ INEC dunyere ya na ntuliaka afọ 2023, ma narakwa ụgwọ ọrụ ya, ya mere, na ọ bụ ihe na-akọ ọkọ n'anya ịhụ ka onye ritere uru na mpụtara ntuliaka ahụ na-eme ka aha onye kpọpụtara ya bụrụ anwụ anwụ. O bokwara ebubo na o nwereike ịbụ ọdịnamma dị n'etiti Alex Otti na Nnenna Oti bụ ihe mere e ji na-ajafe ya mma oke dịka a ga-asị na o mere ihe mmadụ na-emebeghị mbụ.
N'ihi ya, ọ gwara Nnenna Otti na ebe ọ sị na ya bụ onyenkụzi nakwa onye ọrụ obodo a zụrụ nke ọma, ka o were ọsọ were ije gaa gwa Alex Otti na ya achọghị nkwenyeugwu ọbụla si n'aka ya.
Oge ọ na-agbape ọdọụgbọala ahụ, Gọvanọ Alex Otti kwuru na otu ihe mere Ọkankụzi Nnenna Oti jiri pụọ iche bụ maka na ya na ndị ọrụ INEC ibe ya na ndị nchekwa jụrụ ịnara aka azụ, ma guzogide mmaja, nrụrụaka na idegharị mpụtara ntuliaka.



