Ọnọdụ Naịjirịa kemgbe afọ atọ Tinubu nọ n'ọchịchị

Aha onyonyo, Ọnọdụ Naịjirịa kemgbe afọ atọ Tinubu nọ n'ọchịchị
Ọnọdụ Naịjirịa kemgbe afọ atọ Tinubu nọ n'ọchịchị
    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
  • Mgbe e biputara ya

Ọnọdụ akụnụba, nchekwa na ọkụ latrik Naịjirịa aghọọla ndị n'ọchị ndị n'akwa kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu banyere n'ọchịchị n'abalị 29 nke ọnwa Mee n'afọ 2023.

Nchọcha BBC News Igbo gosiri na ọnụahịa ngwa ihe oriri, mmanụ ụgbọala, ụgwọ ụlọ na ọnọdụ enweghị ọrụ arịala nke ukwuu.

N'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023, ụlọọrụ azụmaahịa doro anya bụ FMDQ Securities Exchange Limited kwuru na e ji naịra N464.50 agbanwe otu dọla n'ụlọakụ, ebe e jikwa ego ruru naịra N760 agbanwe otu dọla n'aka ndị ahịa mbugharị bụ 'black market' n'olu Bekee.

Ugbua, ọ bụ otu puku Naịra na narị atọ na iri isii na ise (N1,365) maọbụ otu puku Naịra na narị atọ na iri asaa na ise (N1,375) ka e ji agbanwe otu dọla n'ụlọakụ. Ebe ndị ahịa mbugharị na-ere otu dọla n'ọnụego N1,370 maọbụ N1,395.

Oke ọnụahịa a na-ere mmanụ ụgbọala bụ ihe ọzọ na-echere ụmụafọ Naịjirịa aka mgba dịka otu lita mmanụ ụgbọala a na-ere n'ọnụego N189 maọbụ N198 tinyere ụkwụ ọzọ gbalie elu dịka o ji pasenti 567 ruo n'ọnụegọ N1,320 n'ọnwa Mee 2026.

Tupu Onyeisiala Tinubu abanye n'ọchịchị, ọnụego ihe oriri bụ 'food inflation' nọ pasentị 24.82 mana ụlọọrụ ọnụọgụgụ mba bụ National Bureau of Statistics (NBS) kwuru na nke a agbatuola dịka ọ nọ pasentị 16.06 n'ọnwa Eprel 2026.

Mgbanwe a na-atụ ndị mmadụ n'anya dịka ọnụahịa ngwa nri ka nọ n'elu ọjị na Naịjịrịa. Otu akpa osikapa a na-ere puku iri atọ N30,000 maọbụ puku iri anọ na abụọ N42,000 nọzi N65,000 na N75,000 ugbua; akpa akwa a na-ere ihe dịka N31,000 maọbụ N40,000 nọzi ọnụego N65,000 maọbụ N145,000; ebe ọnuahịa akpa gaarị nọbu N15,000 maọbụ N20,000, nọzi N40,000 maọbụ N70,000 n'afọ 2026.

N'aka nke ọzọ, ọnụahịa otu krate akwa dị mkpụrụ iri atọ a na-erebu N2,200 maọbụ N3,500 n'afọ 2023 ka a na-erezi N5,800 maọbụ N6,500 ebe ọnụahịa achịcha 'bread' e rere N750 ka a na-ere N1,500 maọbụ N3,500.

Oke ọnụahịa ụgwọ ụlọ bụ ihe ọzọ kuuru mmiri tinye n'ọnụ ndị mmadụ dịka ụfọdụ ndị na-akwụbu narị puku Naịra ise (N500,000) maọbụ narị puku naịra itoolu (N900,000) maka ọnụụlọ abụọ bụ '2 bedroom flat' n'afọ 2023 na-akwụzi ego ruru nde naịra abụọ maọbụ nde naịra ise dabere na mpaghara onye ahụ bi na ya.

N'ozi ụlọakụ mbaụwa bụ 'World Bank' wepụtara n'ọnwa Eprel 2026 ka ha kwuru na ọnụọgụgụ ndị dara ụbịam na Naịjirịa gbagoro elu site na pasentị 51 ruo pasentị 63 n'afọ 2025.

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbazi ego n'ụlọakụ mbaụwa bụ International Developement Association (IDA) kwuru na ego ole Naịjirịa gbazitere n'afọ atọ Onyeisiala Tinubu nọ n'ọchịchị bụ ijeri dọla iri na asatọ na ụma ise ($18.5bn) dịka Naịjirịa ji ọkwa dịka mba atọ kachasị ebiri ego n'ụlọakụ mbaụwa.

Ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa ugbua

A bịa n'ọnọdụ nchekwa, Naịjirịa bụ mba mwakpo, ịtọrọ mmadụ na iyi ọha egwu na-echere aka mgba ọkachasị na mpaghara Ugwu, mana a malitela ịhụta nsogbu nchekwa na mpaghara ndịda ọdịda anyanwụ.

Ka ọ dị ugbua, steeti ndị dịka Kwara, Oyo, Kebbi, na Niger steeti esonyela na mpaghara ndị a na-awakpo ma tọrọ ụmụakwụkwọ, ndị okpukperechi na ọtụtụ ndị nkịtị.

Ọnọdụ ọkụ latrik na Naịjirịa

Ụkọ ọkụ latrik bụ ihe na-atọpụ ọtụtụ ezinaụlọ akwa n'ukwu ugbua, mana ị ga-echeta na tupu Onyeisiala Tinubu abanye n'ọchịchị, Naịjirịa na-arụpụta ọkụ latrik ruru 'megawatt' puku anọ na narị abụọ (4,200) dịka ụlọọrụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) si kwuo.

Ugbua, ọnụọgụgụ ọkụ latrik Naịjirịa na-arụpụta agbanwebeghị dịka ọ nọ na megawatt puku anọ na narị abụọ na iri asatọ na isii (4,286).