Amalitere m iti egwu ka m gbachara 'boy' n'Ọnịcha - Sparkle Tee
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Michael ngene
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Mgbe e biputara ya
Otiegwu a ma ama bụ Timothy Ezekiel a maara dịka Sparkle Tee kọwara etu o siri malite njem iti egwu ya.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC News Igbo nwere ka o kwuru na ya malitere itiegwu mgbe ya gbachara odibo.
Dịka o si kwuo, "Agara m gbaa 'boy' afọ isii, ezughị m ohi achụọ m. Ka e mesịrị, nna m ukwu nwere nsogbu n'azụmaahịa ya, ọ dị ka o si adị, onye niile alaa, m bido ụwa n'isi. Ọ bụ etu ahụ ka m siri hụ onwe m n'ogige ndịagha. M tinye ngwaahịa m na 'wheelbarrow' oge ahụ na-ere. Ọ bụ dịka m na-eme ya, ego m na-enwete n'onyonyoo ndị m na-ere ka m jiri na-akwalite onwe m n'iti egwu".
O kwuru na nne na nna ya ekweghị ka ya gaa gbaa odibo na mbụ, maka na nne na nna m bụ ndị nwere mmasị n'agumaakwụkwọ nke ukwuu n'agbanyeghị na ha enweghị ego.
"Mana abịara m lee anya hụ na ihe aka mgba dị n'ịkwụ ụgwọ akwụkwọ, ụmụnne m ndị nke nwaanyị na ndị nke nwoke na-agacha akwụkwọ, mụ onwe m na-aga mana ego adịghị, ma abụ m nwa nke ikpeazụ. M kpebie sị na ọ bụ m ga-ewepụta onwe m n'ezinaụlọ anyị, ka ọ bụrụ na ọ bụ m ga-eji onwe m chụọ àjà maka ezinaụlọ m gaa chọọ ego," ka o kwuru.
Nwaamadi a kwuru na egwu ya ga-akọwarịịrị ihe ndị ya gabigara na ndụ, site n'ịgba 'boy' ruo mgbe ya banyere n'ogbe.
O kwukwara na ya nwetara mkpali mmụọ 'hustledotcom' site n'aka otu nwaanyị aha ya bụ Blessing.
"Ọ kpọrọ ndị na-eti egwu, o nwere oge o tiri egwu si "anyị ekwerewo na oge Chukwu ka mma". Ana m anụ egwu ahụ, m sị na o nwere ihe dị n'egwu ahụ. Akpọrọ m onye na-ahaziri m egwu. Oge a rụchara egwu ahụ etu ọ dị, m tinye ya n'ịntaneetị.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
'Egwu m bụ egwu mbụ mere ka Savio na ndị otu ya wube ewu'
Ọ kọwara si "Etu 'Consider' siri pụta bụ na o nwere onye zara oku ekwentị, oge ọ na-aza oku ahụ, ọ na-agwa onye ya na ya na-ekwu sị "Baba consider m biko". Anụrụ ihe ahụ, ọ banye m n'isi, m gwa Savio ka anyị were ya tee egwu. Ewetere m nkeji nke mbụ ya gụọ ya, ebe niile agbakaa. A chọwa nkeji nke abụọ, gụọ ya. Ya onwe ya agbakwunye irighiri ihe ndị ọzọ. Oge anyị na-eme onyonyoo ya, m sị....i nwetala ọkpụrụkpụ egwu ga-egosipụta gị. Ọ bụ etu egwu a si pụta."
O kwuru na onye ọbula sị na ọ bụghị otiegwu Afrịka kama ọ bụ onye na-eti egwu obodo maka na ọ ji asụsụ obodo ya eti egwu amaghị ihe ọ na-ekwu maka na ọtụtụ egwu ndị anyị ma, dịka 'Awilo Longomba' wuru ewu ihe karịrị afọ iri n'obodo a.
"Mụ na gị amaghị ya agụ, anyị amaghị ihe ọ na-agụ. Ekwesịghị m ịnụ ihe ị na-asụ tupu m hụ egwu gị n'anya. Mba! Egwu bụ asụsụ mbaụwa, eji m aka na ọ bụ etu e siri kwuo ya. Mmadụ mechara kpọọ m sị m "nna, nwanne m nwoke, gịnị mere i nwebeghị otu egwu wuru ewu, ọ bụrụ na ị ga-emepụta otu egwu, ị gụọ ya ma ọ bụrụ na ọ banyeghị, ka m mara ihe kpatara ya," ka o kwuru.
O kwuru na egwu ya ji aga ruo taa bụ asụsụ Igbo juru n'ime ya. "Ya mere, aghọtaghị m ihe ahụ. Nwanne m nwoke, anyị na-agate aka. Amaghị m ma ọ bụ na ị maghị."
Kirie ya n'uju ebe a.



