Emmanuel Emenike: Ihe anyị ma maka akụkọ na Gọọmentị Imo state ji ndị uweojii wakpoo 'Emenike Hospital', Owerri nke ọgbaabọọlụ a

Emmanuel Emenike
Nkọwa foto, Emmanuel Emenike gbabuuru otu egwu bọọlụ Super Eagles bọọlụ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye gbabuuru Super Eagles nke Nigeria egwu bọọlụ bụ Emmanuel Emenike etiela mkpu banyere mwakpo ndị ọrụ gọọmentị Imo steeti wakporo ụlọọgwụ ya bụ Emenike Hospital dị n'Owerri, Imo State.

Mana ụlọọrụ na-ahụ maka mkpocha na nzacha na steeti ahụ bụ Eastern Waste Management Corporation(EWAMAC) agọọla sị na ọ bụ maka na ụlọọgwụ ahụ dara iwu metụtara idowe gburugburu ọcha mere ha jiri bịa n'ụlọọgwụ ahụ.

Emenike gbara Nigeria boolu malite n'afọ 2013 ma gbakwara etu egwu bọọlụ mba offesi gụnyere; Karabükspor, Spartak Moscow, Fenerbahçe na West Ham.

.N'ozi nke Emenike wepụtara n'akara Instagram ya ụbọchị Wenezde, o boro ebubo na ndị ọrụ gọọmentị Imo state na ndị uweojii wakporo ụlọọgwụ ya, kpụrụ onye nchịkọta ụlọọgwụ ahụ na onye odebeego.

Emmanuel Emenike yi akwa egwu bọọlụ Super Eagles

Ọ gara n'ihu kpọku Gọọmentị Imo state na isi ụlọọrụ ndị uweojii ka ha nyocha ihe butere mwakpo e mere n'ụlọọgwụ Emenike Hospita.

Ozi ahụ Emenike wepụtara nke isiokwu ya bụ "Ụlọọgwụ Kwesịrị Ịbụ Ebe Nleta Anya na Nchekwa, Ọ Bụghị Ebe Tigbuo-Zọgbuo," kwuru na ndị ọrụ mkpocha na nzacha wakporo ụlọọgwụ ya n'abalị 21 nke ọnwa October dịka ndị uweojii wakpoburu ha n'abalị 25 nke Ọnwa September, afọ 2026.

Ozi sịrị, " Emenike Hospital na-ekwu na ndị a sị si n' ụlọọrụ na-ahụ maka gburugburu n'Imo state bịara, ka ndị uweojii si n'aka DPO Owerri Urban Division wakpochara n'abalị 25 nke ọnwa Septemba afọ 2026, tie ndị ọrụ nakwa ndị ọrị nọ n'ụlọgwụ ma ma kpụrụ Onye nchịkọta ụlọọgwụ na odebego."

"Ụlọọgwụ bokwara ebubo na ndị uweojii si Oji Police State sokwa bịa ije ahụ.. Ebubo ndị a kwesịrị ka e nyocha ya."

Ọ tụrụ arịrị na dịka ọnọchitechara Nigeria na mba ofesi, welata akụo n'ụlọ site nan iwu ụlọọgwụ, na ihe mere n'ụlọọgwụ ahụ n'abalị 21 nke ọnwa Oktoba afọ 2026 bụ "ihe nnukwu ụfụ".

Ozi ahụ nke ya na ihe onyony abụọ so gosiri ebe ndị uweojii na ndị yi akwa ojii zọbatara n'ụlọ ndị mmadụ juru, banye n'otu ọnụụlọ ma kpụrụ otu nwoke ti akwa na-acha aja aja, pụta ama.

Ihe onyonyo nke abụọ gosiri ebe a kwanyere nwoke ahụ e si n'ụlọ kpụrụ pụta n'ụgbọagbala e dere"Office of The Governor- Monitoring/Compliance(Anti Vandals).

Ihe Eastern Waste Manegement Corporation sara

Dịka akụkọ ahụ gbara n'intanet ma na-ewu na soshal midia, ụlọọrụ na-ahụ maka mkpocha na nzacha na steeti ahụ bụ Eastern Waste Management Corporation(EWAMAC) gọrọ ma sị na ha zigara ụlọọgwụ ahụ ozi gugboro ugboro maka ịda iwu ikpofu atịtị ụlọọgwụ n'ụzọ ezighị ezi mana ụlọọgwu ahụ gbara ha nkịtị.

EWAMAC gara n'ihu kwuo na ndị ndị uweojii ha soro ha gaa ọrụ nwụchiri bụ "ndị banyere ndị ọrụ ọgụ oge ha bịara."

EWAMAC kwuru na ha emerụghị onye ọria ahụ, nke ha na-agbachi ụlọọgwụ 'Emenike Hospita'.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ihe ụmụ Nigeria na-ekwu

Ụfọdụ ụmụamaala Nigeria akatọọla ihe mere Emenike dịka ha na-arụ aka na mwakpo ahụ so nkatọ Emenike katọrọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị uweojii maka nrụrụ aka.