Nafdac ekpuheela ihe gburu 'corper' n'Enugu, dịka Ụlọomeiwu Sịnetị kpọrọ oku ka e mee nnyocha

Ebe foto si, AKINTEYE BABATUNDE AFEEZ/X
Ndị ọ dị n'aka ekwupụtala ihe ha na-enyo enyo butere ọnwụ otu onye ntoroọbịa na-efe ala nna ya bụ Etimbuk Daniel, ogige ọzụzụ NYSC dị n'Awgu n'Enugu state.
Ngalaba na-ahụ maka ụzọ e si eji ọgwụ na ihe oriri eme ihe bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (Nafdac) mere nnyocha ma kwuo na ha na-enyo enyo na ihe butere ọnwụ nwaokoroọbịa ahụ bụ ajọ mmerụahụ nke akụrụ, enweghị mmiri zuru oke nakwa obi mmapụ.
"Nchọpụta ndị a bụ site na nnyocha mbụ anyị mere, mana ha enweghị ike kọwapụta ma ọgwụ ndị ha nyere ya eso bute ọnwụ nwaokoroọbịa ahụ," ka Nafdac kwuru.
N'otu ozi Nnukwu Onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye wepụtara n'ụbọchị Mọnde 19 Ọktoba, o kwuru na ụlọọrụ ahụ malitere ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ọnwụ 'corper' ahụ oge akụkọ malitere ifesa na ọ bụ ọgwụ adịgboroja ọ ṅụrụ gburu ya.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara ahụike
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nans ekwuola etu a sị Daniel siri nwụọ n'ogige ọzụzụ
N'ụbọchị 11 Ọktoba ka otu jikọtara ụmụakwụkwọ Nigeria bụ National Association of Nigerian Students (Nans) kwupụtara gbasara ọnwụ Etimbuk Daniel, mana o dobeghị anya ụbọchị ndị ọ dị n'aka kwupụtara ọnwụ nwaokoroọbịa ahụ.
N'ozi o wepụtara n'akara X ya, Onyeisi otu Nans bụ Akinteye Afeez kwuru na dabere n'ozi ha nwetara, Daniel, onye bụbu Onyeisi ọchịchị ụmụakwụkwọ 'Students' Union Government (SUG)' nke Mahadum Akwa Ibom nwụrụ site n'ọgwụ adịgboroja e nyere ya n'ogige ọzụzụ ndị 'corper' oge o nyechara mkpesa na isi na awa ya.
"Dabere n'ozi ruru anyị aka, Comrade Daniel nyere mkpesa na isi na-awa ya, nke mere ha jiri nye ya ụfọdụ ọgwụ. Mana dịka akụkọ siri kwuo, ọnọdụ ya kawanyere njọ oge ọ ṅụchara ọgwụ ndị ahụ. O kwuru ka ha bugaa ya n'ụlọọgwụ, mana tupu e nweta ikike ime nke ahụ, oge agaala. Nke a mere o jiri nwụọ tupu o nwee ike nata ezi nlekọta ahụike."
"Ha gwara anyị na dọkịta mechara chọpụta na ọgwụ ndị ha nyere ya bụ adịgboroja," ka Afeez kwuru.
Dabere n'ozi ha nwetara, Nans kwuru na ebubo ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ, nke mere ha ji na-akpọ oku ka e mee ezigbo nnyocha iji chọpụta ihe gburu Daniel.
Ụlọomeiwu Sịnetị akpọọla oku ka e nyochaa ihe gburu 'corper'

Ebe foto si, AKINTEYE BABATUNDE AFEEZ/X
Ọnwụ onye ntoroọbịa na-efe ala nna ya n'Enugu abụrụla okwu onye niile kpụ n'ọnụ, nke mere Ụlọomeiwu Sịnetị jiri tinye ọnụ na ya n'ụbọchị 16 Ọktoba 2026.
Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị bụ Godswill Akpabio kwuru na "ozi gbasara ọnwụ erughị eru onye 'corper' bụ Etimbuk Daniel' n'ogige ọzụzụ dị n'Enugu bụ nke na-agbawa obi."
Ọ sịrị na ebe ọ bụ na ihe gburu nwaokorọbịa ahụ edobeghị anya, na Ụlọomeiwu Sịnetị enyela iwu ka e mee nnyocha miri emi gbasara ọnwụ ya, tinyekwara ọnọdụ ụlọahụike ndị nọ n'ogige NYSC gburugburu Nigeria.
Ọ bụ Sịnetọ Aniekan Bassey welitere okwu a n'ọgbakọ Ụlọomeiwu, dịka okwu dị mkpa e kwesịị ilebara anya.
Oge ha rụrịtachara ụka gbasara ya, Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị bụ Godswill Akpabio nyere iwu ka e nyochaa ihe butere ọnwụ Daniel, dịka o hiwere otu nnyocha jikọtara kọmitii dị iche iche, iji chọpụta ihe gburu onye 'corper' ahụ ma nyochaakwa ọnọdụ nlekọta ahụike n'ogige NYSC niile e nwere na Nigeria.
Ndị ga-esonye na kọmitii ahụ gụnyere; Kọmitii Ụlọomeiwu Sịnetị na-ahụ maka Ọdịmma Ndị Uweojii; Kọmitii na-ahụ maka Ngalaba Ikpe Ziri Ezi, Ikike Nke Mmadụ na Okwu Iwu; Kọmitii na-ahụ maka Ezi Usoro, Usoro Akparamaagwa na Mkpesa Ọhanaeze tinyere Kọmitii na-ahụ maka Ahụike.
Ha ga-agbakọrọ ndị uweojii na ngalaba nchekwa DSS aka ime nnyocha a.
Ọrụ ha ga-abụ inyocha mkpesa niile gbasara akụrụngwa ahụike, ndị ọrụ ahụike a zụrụ nke ọma, usoro ọrụ gbatagbata nakwa usoro e ji enyefe ndị 'corper' ọrịa ji aka ọjọọ n'ụlọọgwụ ndị kwesịrị ekwesị.
Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị kwuru na ihe ndị ha chọpụtara ga-aba uru iji mara ụdị enyemaka ndị a chọrọ iji kwalite ọrụ ahụike n'ogige ọzụzụ NYSC gburugburu Nigeria.
Ihe Nafdac chọpụtara gburu Etimbuk Daniel
N'ozi Nafdac wepụtara, ha kwuru na nnyocha mbụ ha mere chọpụtara na e buuru 'corper' ahụ gaa n'ụlọahụike NYSC n'ụbọchị Wenezde 7 Ọktoba 2026, oge o gosiri njirimara ọrịa ịba na ọnya afọ.
Ngalaba ahụike a kwuru na e letara nwaokoroọbịa ahụ anya, mee ka ọnọdụ ya dajụọ tupu ha asị ya lawa ma nye ya mkpụrụ ọgwụ ka chi bọrọ. Ọ lọghachiri n'ụlọahụike ahụ n'ụbọchị Satọde 10 Ọktoba 2026 ma na-enwe mgbu na mpataụkwụ aka nri ya, nnukwu ụsụsọ na ọbara mgbatu ala na-ekweghị akwụsị akwụsị.
N'ihi ọnọdụ ahụike ya na-akawanye njọ nakwa anyụghị maamịrị nke ọma na-agbanyeghị mmiri ndị a gbanyere ya n'ahụ, ụlọahụike ahụ sịrị ka e buru ya gaa n'ụlọọgwụ University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH), dị n'Ituku-Ozalla, bụ ebe ọ nọọrọ koripụ. "Mbọ niile a gbara iji tutegharịa ya kụrụ afọ n'ala," ka Nafdac kwuru.
Nafdac gbakwunyere na nnyocha mbụ ha mere "na-enyo enyo na ihe butere ọnwụ nwaokoroọbịa ahụ bụ ajọ mmerụahụ nke akụrụ, enweghị mmiri zuru oke nakwa obi mmapụ."
Di agency make am clear say dis findings na preliminary and e no demsefs establish weda di medicines wey dem give am contribute to im death.
Ngalaba a mere ka o doo anya na nchọpụta ndị a bụ site na nnyocha mbụ ha mere, nke na-anaghị ike kọwapụta ma ọgwụ ndị ha nyere ya eso bute ọnwụ nwaokoroọbịa ahụ
Ozi ahụ gbakwunyere na ndị ọrụ Nafdac agaala n'ogige NYSC ahụ, gbaa ndị ọrụ ahụike letara 'corper' ahụ nakwa ndị ọrụ ndị ọzọ ajụjụ. Ha ewerela ọgwụ ndị e nyere nwaokoroọbịa ahụ maka inyocha ha.
"Ngalaba a ga-eme ihe niile kwesịrị ekwesị dabere na mpụtara nnyocha ha," ka Nafdac kwupụtara.
Nafdac kasiri ezinaụlọ Etimbuk Daniel obi maka ọnwụ ya ma gwa ọhanaeze ka ha dere duu dịka nnyocha na-aga n'ihu.






























