Gịnị mere ụfọdụ ụmụnwoke ji agba ọgwụ iji mee ka amụ ha buo ibu?

Aha onyonyo, Gịnị mere ụfọdụ ụmụnwoke ji agba ọgwụ iji mee ka amụ ha buo ibu?
Gịnị mere ụfọdụ ụmụnwoke ji agba ọgwụ iji mee ka amụ ha buo ibu?
Mgbe e biputara ya

Ihe na-ewu n'ọbaozi ịntaneetị ugbua bụ akụkọ gbasara otu nwoke bụ nwaafọ Naịjirịa a sị nwụrụ ka ọ gbachara ọgwụ iji mee ka ogbe amụ ya gbaa agba.

Akụkọ kwuru na nnyocha e mere ozu ya chọpụtara ụfọdụ irighiri kemikalụ a kpọrọ hyaluronic acid na ngụ ya, bụ nke a sị so bute ọnwụ ya.

Nke a mere ka ndị mmadụ na-ajụ sị kedụ ihe mere ụfọdụ ụmụwoke ji achọ ka amụ ha buo ibu nakwa ọghọm dị na ya.

Dọkịta Dike Victor Okechukwu, onye bụ dibịa Bekee a na-ahụ maka ahụike nke ezinaụlọ sara ụfọdụ ajụjụ ndị a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ n'oge gara aga.

Na nkọwa ya, Dọkịta Okechukwu kwuru na ụfọdụ ụmụnwoke na-eji obere utu alọ ụwa, bụ nke a na-akpọ 'micro penis' na Bekee nke mere ndị nne na nna ha chọọ ụzọ a ga-esi gboo nsogbu a.

Ọ sịrị na a na-awa ahụ nwata nwoke dị etu ahụ mgbe ha gbara otu afọ maọbụ abụọ iji mee ka amụ ha buo ibu dịka e siri chọọ.

Dịka o siri kọwaa, ọ bụrụ na e meghị nke a, nwata ahụ ga-eburu obere amụ ahụ too, nke nwereike ime ka ọ chọwa ụzọ ọ ga-esi mee ka amụ ya buo ibu mgbe o toro.

N'ọzọ yiri ya, nchọcha BBC mere chọpụtara na e nwere usoro dị iche iche e ji eme ka ogbe amụ nwoke gbaa gbaa, nke gụnyere ịwa ahụ na ịgbanye nwoke ihe ndị dị aṅaa n'utu.

Nchọcha ahụ kwuru na otu akụrụngwa kachasị na-ewuru ụmụnwoke bụ nke a kpọrọ hyaluronic acid, nke bụ akụrụngwa kemikal gbara ọkpụrụkpụ e ji eme ka egbugbereọnụ kwee ekwee.

Ha kọwara na akụrụngwa kemikal a enweghị ike ime ka amụ nwoke too ogologo, kama ọ na-eme ka ogbe amụ buo ibu, oge ụfọdụ, dịka oloolo mmanya. Nke ọzọ a bụrụ na ibu ahụ anaghị adịgide, ma ọ bụrụ na a gbanyeghị kemikal ahụ site na mgbe ruo na mgbe.

Dịka BBC siri chọpụta, ụfọdụ ihe ọghọm dị n'ịgbanye akụrụngwa hyaluronic acid n'amụ nwoke gụnyere; inwe ọnya n'elu amụ, okpu amụ iji ojii, mkpọnwụ anụahụ amụ, mmerụahụ nakwa ibute nje. Ọzọ abụrụkwa na kemikal a nwereike mebie akwara ndị na-enyere amụ nwoke aka ikeli.

Dọkịta Okechukwu kọwakwara na ụfọdụ ụmụnwoke utu ha na-ebughị ibu nwereike zute ihe aka mgba oge ha na nwunye ha na-esuru ji na mmanụ, ebe o nwekwara ike metụta ohere ha ịtụwa nwaanyị ime.

Ka o sinadị, o kwuru na nke ahụ apụtaghị na nwoke ọbụla ntanta ya na-ebughị ibu agaghị amụli nwa, n'ihi na e nwere ihe ndị ọzọ a ga-elebara anya iji chọpụta ma ọnọdụ ahụ o nwereike metụta ohere nwoke dị etu ahụ ịtụwa nwaanyị ime.

Ọ sịrị na ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri obere amụ tolite, na o nwere ụfọdụ ihe ndị ọrụ ahụike nwereike ime iji hụ na nwoke dị etu ahụ kụrụ nkwa n'ihu akpụkpọ n'ọgbọ egwu ma hụkwa na nwunye ha anọghị na mmiri, nchaa abaa ha n'anya.