Etu otu onye si buru Ebola gaa mba atọ n'Africa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Wycliffe Muia
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Otu onye ojiegoachụego mba Kenya nọrọ n'ebe Ebola na-akpọtụ ma si ebe ahụ gaa mba atọ ndị ọzọ tupu a mara na o bu ya bụ ọrịa.
Ọ bụ oge nwoke ahụ gbara afọ 40 dara nnukwu ahụ n'otu ụlọọgwụ dị na Naiirobi ka a chọpụtara na obu ya bụ ọrịa.
O mechara nwụọ ka abalị abụọ gachara, n'abali ise nke ọnwa Oktoba, afọ 2026, ma bụrụ onye mbụ a ma butere ọrịa Ebola na Kenya.
Na a chọpụtaghị ọrịa o bu n' ọtụtụ ụlọọgwụ dị na mba DR Congo nakwa ọdọụgbọelu Uganda nakwa nke Kenya akpalitela ajụjụ banyere etu ọrụ nche ahụike mba ndị a n' igbochi nkesa ọrịa.

Ebe foto si, EPA
Ihe karịrị mmadụ 4,000 anwụọla site n'Ebola na mba DR Congo n'afọ a, nke abụ ntiwapụ nke abụọ kachasị.
Akụkọ nke Onyeisi gbatagbata otu Africa CDC bụbụ Dkta Wessam Mankoula ọrọ gosiri n'ụzọ were anya etu ojiegoachụego ahụ si mee njem puku kwuru puku kilomita dịka ọrịa ya na-akawanye njọ.
Nwoke ahụ nke a gbabeghị aha ya n'anwụ biri na mba DR Congo afọ asaa ma mee njem gaa mpaghara atọ na mba ahụ maka azụmahịa.
O doghị anya mgbe maọbụ ebe o butere ọrịa Ebola mana Ebola dị na mpaghara atọ ndị ahụ ọ gara na DR Congo, dịka otu ahụike mbaụwa bụ WHO si kwuo.
Na nwgụcha ọnwa Ọgọstụ na mmalite Septemba, nwoke ahụ gara obodo Buta, Aketi na Likati dị na mpaghara Bas-Uélé dị na DR Congo.
WHO kwuru n'ọnwa Ọgọst na e nwere ọrịa Ebola na Buta tupu ọ gaa ebe ahụ mana o nweghị ihe akaebe gosiri na ọ bụ ebe ahụ ka o butere ya.
Njirimara ọrịa ya pụtara n'abalị 15 nke ọnwa Septemba. A gbara ya 'antibịọtiks, sị ya lawa.

Ebe foto si, EPA
Ka abalị abụọ gachara, enyere ya akwa n'ụlọọgwụ 'Tongo Etandi Health Centre' dị na Bondo ebe ọ n orọ rue abalị 19 nke ọnwa Septemba.
Na -agbanyeghị na ahụọkụ na-ere ya , ihe wụkasịa ya n'ahụ, ndị ụlọọrụ gwara ya na ọ bụ ihe mwhụkasị akpụkpọ ahụ na-enye ya nsobu.
Dịka e nyochaghị ya ahụ maka Ebola, ọ hịara ahụ ikwu kpọmkwem, ebe ọ nọ bute ọrịa ahụ n'ije ya.
Njirmara ọrịa ọ na-egosi bụ njimara onye nwetara ọrịa Ebola ọhụrụ mana ọ bụkwa njirimara ọrịa ndị ọzọ a na-ahụ na mpaghara ahụ dịka ọrịa ịba.





























