You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Justice Chidiebere: Ụlọikpe enyela iwu ka a tụnye nwa amadi a na mkpọrọ DSS
Ụlọikpe enyela iwu ka a tụnye Justice Chidiebere n'ụlọmkpọrọ DSS.
Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela iwu ka a tụnye Justice Chidebere a ma ama dịka 'Justice Crack' na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ Department for State Secret Service(DSS) maka ebubo metụtara mpụ intanet (cybercrime) na ịkpa nkata ibute ọgbaghara (breach of public peace.)
Mana Chidiebere gọrọ n'aka ya dị ọcha dịka a gụputara ebubo ndị ahụ n'ụlọikpe.
Ọkaiwu wetara ikpe ahu n'ụlọikpe bụ Mark Oruba rịọrọ ọkaikep ka e jichie nwa amadi ahụ ruo oge a ga-amalite ikpe ya n'uju.
Mana ọkaiwu nọchitere Chidiebere bụ Marshall Abubakar rịọrọ ụlọikpe ka a tọhapụ ya, nye ya ohere isi ụlọ ya na-abịa ikpe ahụ.
Jọstịs Joyce Abdulmalik nọ n'isi ya bụ ikpe jụrụ ajụ ma sị ya dee arịrọ ya n'akwụkwọ kama iji ọnụ arịọ ya.
Ọ gara n'ihu nye iwu ka a tụnye ya na mkpọrọ DSS ganye abalị Mee 25 bụ ụbọchị a ga-ekpe ikpe ahụ ọzọ.
Na nsonso a, Chidibere , onye bi na Lugbe dị n'Abuja, mere ihe ononyo ebe ọ katọrọ ndị agha maka mgbagbu a sị ndị otu ha gbagburu o ut nwata nwoke ji otu afọ efe ala na ya O mekwara ihe ọzọ ebe ọ katọọ ndịagha Naijiria aka anaghị enye ndịagha nọ n'ihu agha megide ndị agha nnụpụisi ezigbo nri.
: Ndị ntorobia kwụchiri ụzọ jụ inye ohere ka DSS kpụrụ Justice Chidiebere a pụọ n'ụlọikpe
Ndị ntorobia na ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye gbochiri ndị uweojii nzuzo a na-akpọ "Department of State Services, (DSS)" ịkpụrụ nwọke aha ya bụ Justice Chidiebere pụọ n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja.
Chidiebere bụ onye a maama na sohal mịdịa dịka 'Justice Crack'.
Ndịagha Naijiria jidere ya maka ebubo dị icheiche banyere onyoonyo o mere ma kasaa na soshal mịdịa tupu ha aranye ya n'aka ndị uweojii nzuzo.
Ha bokwara Chidiebere ebubo imebi iwu mgbasaozi ndịagha na-akatọ ụdị nri ndịagha nọ n'ihu ọgụ na-eri.
Mana ndị ntorobia na-eti mkpu sị, "Hapụnụ Justice Crack". "Anyị agaghị ekwe".
Ha gbara Justice gburugburu jụ inye DSS ohere ịkpụrụ ya pụọ dịka ha kpụtachara ya ụlọikpe.
A malitere ịchọ Chidiebere achọ n'abalị 28 nke ọnwa Eprelu dịka ọ gwara nwunye ya ka ọ gaa nzukọ.
Nnyọcha ji igwe intanet mee rụtụrụaka n'ebe ikpeazụ ahụ ya bụ n'ogige ndịagha.
E mechara Ndịagha Naịjirịa ekwuo n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Satode na ọ bụ ha ji ya.