You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Eprel 16, 2026
Akụkọ dị mkpa - Eprel 16, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Popu Leo XIV awụchiel mba Kamerunu maka ụkwụ nke abụọ na njem ya n'Africa, ka ọ gachara mba Ọljirịa.
- Ndị nabatara ya n'ọdọụgbọelu Yaoundé International Airport gụnyere Praịm mịnịsta mba Kamerun bụ Josepgh Dion Ngute, Onye ji ọkwa Apostolic Nuncio na Kamerunu na Ekwitorịal, ndịisi ụka dị iche iche nakwa ọtụtụ ndị ụka katọlik ndị ọzọ.
- Popu Leo ga-ezute Onyeisiala Paul Biya, ma kaa ụka mass na Bamenda ebe ọ ga-anọ kpọọ oku udo na mpaghara ahụ agha na-ada kemgbe ọtụtụ afọ.
- Atiku Abubakar bụbu osote onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ntuliaka afọ 2027 ga-abụ oge ikpeazụ ọ ga-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.
- O kwuru na ọ ga-akwado onye ọbụla pati ya bụ African Democratic Congress (ADC) họpụtara ga azọrọ ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka ahụ ma ọ bụrụ na a họpụtaghị ya.
- Atiku Abubakar azọọla ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ugboro isii kemgbe afọ 1993.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.