Ihe mere m ji hapụ pati ADC - Peter Obi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Peter Obi bụbu aka chịrị Anambra steeti nakwa onye ji ọkọlọtọ Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023, ekwuola ihe mere o ji hapụ pati ADC dịka a na-akwadobe ntuliaka afọ 2027.

Peter Obi kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'aka X ya ma kwuo ihe mere o ji kpebie isi na ADC pụọ.

Ka ọ dị ugbua, Peter Obi ekwughị pati ọ ga-abanye mana a na-atụanya na ọ ga-ekwuputa patị ọhụrụ ya na nso nso a.

Cheta na otu Obidient Movement na-akwado Peter Obi, kwuru na Peter Obi na ndị isi kara aka ka na-enwe mkparịtaụka iji chepụta ụzọ ka mma iji hụ na e nwere mgbanwe na Naịjirịa.

Ozi onyeisi Obidient Movement bụ Yunusa Tanko wepụtara, gwara ndị nkwado ha ka ha nwee ndidi ma kwe nkwa na Peter Obi ga-ewepụta ozi n'oge na adịghị anya banyere pati ọhụrụ ọ ga-abanye.

Peter Obi ahapụla pati ADC

Peter Obi ekwupụtala mkpebi ya ịhapụ Pati African Democratic Congress (ADC).

Aka chịburu Anambra Steeti kwuru na mkpebi ya ịhapụ ADC abụghị maka na onyeisioche ha bụ David Mark na Atiku Abubakar mejọrọ ya kama ọ bụ maka na ndị ahụ tinyere ọgbaaghara na Labour Pati amalitekwela itinye ọgbaaghara na pati ADC.

N'ozi Peter Obi wepụtara n'ụbọchị Sọnde abali atọ nke ọnwa Mee, 2026, o kwuputara mwute banyere etu ọtụtụ ndị mmadụ si eleda ya anya nakwa etu e si agba onye nwere ezi omume mgba okpuru na Naịjirịa.

N'agbanyeghị na Obi ekwubeghị pati ọ ga-abanye, gara n'ihu kwuo na ọchịchọ obi ya ịbụ onyeisiala abụghị okwu ọnwụ na ndụ, kama na ọ chọrọ ịhụ na e nwere ezi ọchịchị kwenyere na nkwalite, nchekwa nakwa ọdịmma ụmụafọ Naịjirịa.

O kwuru na ya nwere olileanya na Naịjirịa ga-abụ mba ga-enweta ezigbo ndị ọchịchị ga-akwalite ikpe ziri ezi ma nye onye ọbụla ohere dịịrị ha.

Cheta na Peter Obi bụ aka chịburu Anambra Steeti ma bụrụkwa onye jiri ọkọlọtọ Labour pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Rabiu Kwankwaso ekwuola na ya abanyebeghị pati NDC

N'aka nke ọzọ, Rabiu Musa Kwankwaso emeela ka o doo anya na ya abanyebeghị pati Nigeria Democratic Congress (NDC).

Kwankwaso kwukwara na ya ekpebibeghị ịzọ ọkwa onyeisiala maọbụ onye ọ ga-akwado n'afọ 2027 ma gbakwụnye na ADC ekwubeghị mpaghara Naịjirịa onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala ga-esi apụta.

Nke a na-abịa dịka akụkọ malitere ifesa na soshal midia na Peter Obi na Kwankwaso ahapụla ADC ma banye NDC iji zọọ ọkwa Onyeisiala na osote onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2027.

Kwankwaso kọwara n'ozi o wepụtara n'akara X ya na ya na ndị nkwado ya ka na-atule uche banyere pati ọzọ ha ga-abanye dịka okwu banyere onye ga-eji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) zọọ ọkwa na ntuliaka 2027 malitere ifesa.

O kwuru na mkpebi ụlọikpe kachasị na Naịjirịa banyere onye bụ onyeisioche ADC nakwa atụmatụ Ọkaikpe ukwu Naịjirịa ịkachapụ aha ADC na pati ndị ga-azọ ntuliaka n'afọ 2027, emeela ka ya na ndị nkwado ya malite ịchọ pati ọzọ ha ga-abanye.

N'okwu ya, "Mụ na ndị nkwado m na ndịisi pati NDC, PRP na ndị ọzọ, amalitela inwe mkparịtaụka banyere ụzọ anyị ga-eji chekwaa ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa".

Ọ gara n'ihu kwuo na kemgbe afọ 2014 na 2019 ọ zọrọ ọkwa onyeisiala na pati APC na PDP ma daa na ntuliaka imeụlọ ha, ọ gara n'ihu kwado ndị patị ya họpụtara na ntuliaka afọ ndị ahụ.

Kwankwaso bụbu Gọvanọ Kano steeti nakwa minista nchekwa, kwuru na ihe mere ya ji abịaghị ọgbakọ abụọ ADC mere na nso nso a bụ maka ọgbakọ ndị ọzọ ya nwere ma kwuo na ya gwara ndịisi maka ọgbakọ ndị ahụ.