Donald Trump enyela nne Javits Frimpong bụ nwafọ mba Ghana e gburu na Bronx akwụkwọ ikike njem Visa

Javits Frimpong na Donald Trump
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala mba America bụ Donald Trump enyela Doris Adu Gyamfi bụ nne Javits Frimpong e gburu na mpaghara Bronx dị na America akụkwọ ikike njem Visa ka ọ nweike ịkwanyere nwa ya nwoke ugwu ikpeazu.

Javits Frimpong bụ nwatakịrị nwoke dị afọ iri na ise. A gbagburu ya n'ụbọchị Thursday n'ụzụ ụtụtụ.

Mayor New York bụ Zohran Mamdani ji akara X kwuo na Onyeisiala Donald Trump ekwetela ka e nye nne Javits Frimpong akwụkwọ ikike njem Visa.

Zohran Mamdan kwuru sị na ọ bụ n'ekwentị ka ya na Donald Trum nwere mkpebi ahụ ma kọwa ọnwụ Frimpong dịka "ihe ụfụ nne na nna ọbụla ekwesighị inwete ọkachasị ndị nke nọ n'ebe tereaka."

''Nne Javits Frimpong kwesiri ịbịa kwanyere ya ugwu ikpeazụ ma nọrọ ebe a gwa ya laa nke ọma. Ọ bụ n'ekwentị ka m na Onyeisiala Trump kpachara nkata ọ ma kwete ka e nye ya akwụkwọ ikike njem Visa ozugbo ozugbo".

''Onye ọbụla na New York City na-eri uju maka ọdachi a".

Fọtọ a bụ na NEW YORK ka e sere ya na NOVEMBER 23 2009 ebe otu nwaanyị na-ebe akwa mgbe ọ na-egere okwu ezinaụlọ onye a gbagburu na-ekwu maka nwa ha nwụrụ anwụ dịka ha na-emuru ya anya abalị. Nke a mekwara na mpaghara Bronx borough nke New York City.

Etu e si gbuo Javits Frimpong

Nna Javits Frimpong kwuru na a gbagburu ya n'ihe dịka elekere itoolu n'ihe dịka tinkomtinkom iri abụọ.

Ebe a gbagburu Javits Frimpong dị nsọ n'ụlọ ha. A gbara ya egbe ahụ mgbe ọ na-aga akwụkwọ.

Mana ihe butere e ji gbagbuo ya edobeghị anya.

Ugbua a na-chọ ụmụaka atọ a na-enyo enyo na ha gburu Javits Frimpong maka na ha si n'ebe ọ nwụrụ gbapụ ọsọ.

Foto sitere na nyocha a na-eme gosiri oge Javits Frimpong na-agba ọsọ ndụ ya dịka a na-achụ ya ọsọ ebe otu onye n'ime ndị ahụ nyi uwe ojii ma kpuchie ihu ya.

Ọnọdụ e ji see foto abụọ ndị a dị icheiche mana ha abụọ gbadoroụkwụ na ndị a gbara egbe maọbụ gbuo na mpaghara mpaghara Bronx dị na New York City n'America.

Ihe gọọmenti mba Ghana kwuru

Gọọmenti mba Ghana kwuru na ha ga-eme ihe niile dị n'iwu ka ha nwete ikpe ziriezi maka ọnwụ Javits Frimpong.

Ụlọọrụ nnochiteanya mba Ghana dị n'America mere ka a mata nke a ma kwuo sị "anyị ga-agba mbọ hụ na ndị mere ihe a nwetere ntaramaahụhụ dịrị ha".

Ha ji ohere ahụ gwa gọọmenti mba America ka ha mee ezigbo nnyocha ma nye nkwado ga-eme ka e jide ndị mere ihe a.