INEC sị ha achọpụtala ndị tinyere foto AI na ndekọ ndị ga-atụ vootu
Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission, INEC enyela nkọwa banyere etu foto AI si banye na ndekọ ndị ga-atụ vootu n'afọ 2027.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ICT n'ụlọọrụ INEC bụ Lawrence Bayode gwara ụlọọrụ mgbasaozi na Nigeria na nnyocha ha merela gosiri na ọ bụ ndị ụfọdụ ndị ọrụ ha na-edebanye aha ndị ga-atụ vootu tinyere foto e ji akụrụngwa AI rụọ.
Lawrence Bayode kọwaara na e mere nke a na mpaghara dị iche iche na Nigeria.
N'okwu ya "anyị nwere ndị gara ọrụ idebenye aha ndị mmadụ. Ọtụtụ n'ime ha nwere ikike imepe akụrụngwa ndekọ aha ndị mmadụ".
Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ foto ndị ahụ abụghị AI ebe ọtụtụ n'ime ha bụ maka na usoro e si debanye aha ndị ahụ adịghị mma.
Bayode kwuru na Inec ahụla ndekọ ndị ahụ ma ghọta etu foto AI ahụ si banye na ndekọ ndị ga-atụ vootu mana ihe ha na-enweghi ike ịkọwanwu bụ ihe kpatara ndị ọrụ ha ji mee ihe ha mere.
Gụọ akụkọ n'uju n'ebe a INEC sị ha achọpụtala ndị tinyere foto AI n'ime akwụkwọ ndekọ ndị ga-atụ vootu




