A tọrọla ụmụakwụkwọ gara ide ule NECO na Kogi steeti
Ndị ojiegbe atọrọla ụmụakwụkwọ gara ide ule NECO nakwa onyeisi ụlọakwụkwọ Kogi steeti.
Ozi ndị uweojii steeti ahụ wepụtara kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọakwụkwọ Government Secondary School dị n’Olowa n’okpuru ọchịchị Dekina nke steeti ahụ n’ụbọchị Tuzde 14 Julaị, 2026 dịka ụmụakwụkwọ na-ede ule NECO ma tọrọ ụmụakwụkwọ abụọ, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ nakwa otu onye ọrụ ụlọọrụ NECO na-ahazi ule ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Saliu Oyiza Afusat kọwara na nnyocha ha mere ngwangwa ha nwetere ozi banyere mwakpo ahụ chọpụtara na gọọmenti steeti ahụ machiri ụlọakwụkwọ ahụ n’ihi na ọ dị ebe zoro ezo tinyere nsogbu nchekwa a na-enwe na mpaghara ahụ.
O kwuru na akụkọ na-ekwu na e ji ụlọakwụkwọ mere ebe a kpọrọ special centre n’olu bekee maka ule NECO. Nke a bụ nke iwu na-akwaodghị.
Afusat kwuru na ha chọpụtara na ọnọdụ ụlọakwụkwọ ahụ bụ nke jọgburu onwe ya n'ihi na o nweghị ụzọ, mpio nakwa gbamgbam.
Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Kingsley Femi Fanwo kwuru na nwaanyị abụọ ahụ so na ndị na-ede ule ahụ a tọọrọ abụghị ụmụakwụkwọ Government Secondary School, Olowa.
Ọ kọwakwara na nhazi ule n'ụlọakwụkwọ ahụ nupuru isi nye iwu gọọmenti Kogi steeti banyere nchekwa ụmụakwụkwọ na-ede ule NECO na steeti ahụ.
N'agbanyeghị nke a, Gọvanọ Ahmed Ododo na-achị steeti ahụ kwuru na o nyela iwu ka ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha, DSS nakwa ndị nchkewa ime obodo malite nnyocha iji hụ na a zọpụtara ndị ahụ a tọọrọ ma nwụchikwaa ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ha.
Ọ gara n'ihu kwe nkwa na gọọmenti ya kwụrụ chịm ịhụ na enwere ezi nchekwa zuruoke na Kogi steeti ma kwuo na ozi banyere mpụtara nnyocha ndị uweojii na-eme banyere mwakpo ahụ ga-agba n'anwụ n'oge adịghị anya.



