Etu m si akwalite egwuregwu Para Badminton na Naịjirịa - Onwukwe Obioma
Etu m si akwalite egwuregwu Para Badminton na Naịjirịa - Onwukwe Obioma
Mgbe e biputara ya
Onwukwe Obioma bụ onye nwere nkwarụ ma nwee nnukwu ịhụnanya n'egweregwu para badminton.
Ọ gwara BBC Igbo maka njem ya na badminton na etu o si nyere ndị egwuregwu aka ịzụ ha ma nweta ọtụụ ihe nrite site na egwuregwu para badminton.
Nwaamdị ahụ bụ onye Abia steeti kwuru na ọ bụ ịhụnanya o nwere mere o ji enye ndị ibe ya nwere nkwaru ọzụzụ nakwa nkwado iji nyere ha aka ịbụ ọkaibe n'egwuregwu para badminton.
Onwukwe Obioma eritela ọtụtụ ihe nrite dị iche iche site n'egwuregwu para badminton ma nyekwara aka na-akwalite egwuregwu para badminton na steeti ya nakwa na Naịjirịa niile gbaa gburugburu.
O kwuru na ebu m na uche ya bụ inyere ndị egwuregwu ibe ya nwere nkwarụ aka ma kuziere ha ma nyere ha aka imezu ihe ọbụla ha chọrọ imezu.






