Etu ndị na-agba ọsọ ehi si zọgbuo nwaanyị dị ime n'Ọba, Anambra Steeti

Etu ndị na-agba ọsọ ehi si zọgbuo nwaanyị dị ime n'Ọba, Anambra Steeti

Ihe ịgba anyammiri a mere n'Ọba dị n'Anambra Steeti oge nwaanyị dị ime ọnwa itoolu aha ya bụ Adaobi Precious gara akwamozu n'Obodo Ogbenwe.

Ehi e kedoro n'ụdọ, fere isi kpaka kpaka, tibie n'ụdọ were wakpo ndị biara akwamozu.

Ndị nọ mgbe o mere kwuru na Adaobi soro ibe ya na-agba ọsọ, mana ọ dara n'ala, ndị na-agba ọsọ wee zọgbuo ya, ma zọgbuo nwa o bu n'afọ.

Enyi ya nwaanyị bụ Chinazo Peace Okoye ji obi gbawara agbawa kọọrọ BBC Igbo ka mkpamkpa ahụ siri mee.

“Adaobi Precious pụtara n'ụlọahịa m na Tọzde gara aga kwụsị ịzụta ihe, o bu ụmụ ya anọ n'ọgbaatumtum. Ọ gwara m na ya laa ozugbo ya agawa akwamozu n’Ogbenwe Ọba be anyị”

“Obi gbawara m ka m nụrụ na ehi e kedoro na ya bụ mmemme tibiri ụdọ were chusasịwa ndị mmadụ. Adaobi enweghị ike ịgba ọsọ n’ihi na ọ dị ime ọnwa itoolu” a maara m na ime ya eruola ọnwa itoolu maka na ọ gwara m na oge ịmụ nwa ya eruola ọnwa itoolu.”

Ọ gara n’ihu kọọ na Adaobi dara ada ka ọ na agbara ehi ahụ ọsọ, ọtụtụ ndị na-agba ọsọ azọọ ya ụkwụ n'afọ nke mere o jiri nwụọ.

Nwaada Angela Onyeze na Chinazo Onoye gwara BBC na nwa nọ Adaobi n’afọ nọ na-agba lika lika mgbe ha jiri ọsọ buru nwaanyị ahụ gawa ụlọọgwụ.

“Ọ gbọrọ ihe niile oriri n'akwamozu ahụ, mana tupu anyị eruo ụlọọgwụ, ya na nwa ya anwụọla”

Otu ihe doro anya bụ na kwa mgbe ka ehi ịdọbiri n'ụdọ ji emeru ndị mmadụ ahụ n'emume dị iche iche.

Dịka Chinazo na ndị ọzọ siri kwuo, oge eruola n'ezie mgbe ndị Eze na ndị ọchịchị obodo di iche iche n'ala Igbo ga-amachi ndị mmadụ ịkpụta ehi na ndụ kwụwa ya na mmemme, kama onye ahụ chịrị ụdọ gosiri na o nwere ebe o liwere ehi.

Ọtụtụ ndị maara nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ nọ na soshal midịa na-ebe akwa na nwaanyị ahụ bụ onye na-agba mbọ nke ukwuu. Ọ hapụpụkwara ụmụ anọ were laa mụọ.