You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Agha Ịran emeela ka ọnụego okpunnabụenyi rịa elu n'ụwa niile
Ụlọọrụ mba Maleshịa kachasị arụpụta okpunnabụenyi n'ụwa niile bụ Karex, na-emepụta okpunnabụenyi ruru ijeri ise kwa afọ ọbụla, ekwuola na ọnụahịa okpunnabụenyi arịala n'ụwa niile n'ihi agha Ịran.
Ụlọọrụ ahụ mere ka o doo anya na agha ahụ dị n'etiti mba Amerịka na Ịran metụtara ọwara Strait of Hormuz bụ ọwara e si ebuga mmanụ ụgbọala nakwa ngwaahịa ndị ọzọ site na mba ruo na mba.
Onyeisi ụlọọrụ Karex bụ Goh Miah Kiat, kwuru na ọnụahịa mmanụ ụgbọala na-emetụta ihe niile ọkachasị akụrụngwa ha ji emepụta okpunnabụenyi.
O kwuru na ụlọọrụ ya na-eji akụrụngwa e ji mmanụ emepụta dịka ammonia bụ ihe e ji echekwa ndụ rọba bekee kpọrọ latex nakwa mmanụ silikọn emepụta okpunnabụenyi.
Nke bụ eziokwu bụ na ọnụahịa okpunnabụenyi nọzi n'elu ọjịi nye ụfọdụ ndị bi na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka.
Oke ọnụahịa ihe oriri, mmanụ ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ bụkwa nsogbu nye ọtụtụ mmadụ.
Ọ bụrụ na ọnụahịa okpunnabụenyi rịa n'ụwa niile, ihe nke a pụtara bụ na inweta ya ga-abụ nsogbu nye ọtụtụ mmadụ.
Nke a nwekwara ike ibute ọtụtụ ime mkpuke nakwa nfesa ọrịa dị iche iche a na-ebute site na mmekọ nwoke na nwaanyị.