Anyị kwụrụ ụgwọ na dọla tupu a tọhapụ ụmụaka anyị - Nne na nna ndị na-aga NYSC a tọọrọ

Ebe foto si, Getty Images
Nne na nna otu onye na mmadụ 20 ahụ a tọọrọ oge ha na-eme njem maka emume National Youth Service Corps (NYSC) n'imo state, agwala BBC na ha kwụrụ ụgwọ na dọlas tupu ndị ntọrị a tọhapụ ụmụaka ha.
Nne na nna ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha, kwuru na enweghị ọrụ ndị ọrụ nchekwa ọbụla rụrụ banyere ntọhapụ ụmụaka ha.
Ọ dị mkpa ka ị mara na iwu Nigeria megidere ịkwụ ụgwọ mgbapụta a kpọrọ 'ransom' n'olu bekee.
Cheta na ndị uweojii wepụtara ozi ma kwuo na ha gbara mbọ nke uwkuu iji hụ na a tọhapụrụ mmadụ 20 ahụ.
Mana otu nne na nna ahụ gwara BBC Yoruba na: "Enweghị ndị ọrụ nchekwa ọbụla ọ bụ mbọ ha mere ka a tọhapụ ụmụaka ha. Ọ bụ anyị bụ ndị nne na nna, ndị enyi anyị nakwa ndị nwere obi ọmịịko, gbakọtara weta ego iji hụ na ndị nne na nna kwụrụ ụgwọ ntọhapụ ndị ntọrị ahụ kwuru na ha chọrọ".
Ọ gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ Department of State Services (DSS) gbara mbọ ịhụ na a tọhpụrụ ụmụaka ha dịka ha kpọrọ ndị nne na nna iji nyere ha aka na nnyocha ha mere.
O kwuru na ndị ọrụ DSS maara etu ndị nne na nna si gbanwe naịra n'aka otu onye Hausa na-agbanwee ego iji nweta dọla bụ nke ha ji kwụọ ụgwọ ransom ahụ.
"Ọ bụ nnukwu ego, ọ bụghị obere ego," ka ọ gwara BBC mana ọ kwughị ego ole egọ ahụ bụ.
Mmadụ 20 ahụ nọrọ ọtụtụ ụbọchị n'aka ndị ntọrị ahụ tupu a tọhapụ.
Ndị 'corper' 20 a tọọrọ n'Imo State enwerela onwe ha - Olubadan

Ebe foto si, Olubadan
A tọhapụla ndị ntoroọbịa iri abụọ ji otu afọ na-efe ala nna ha Bekee kpọrọ, 'National Youth Service Corps' (NYSC) nakwa otu onye ọzọ a tọọrọ n'okporoụzọ si Owerri gawa Onitsha n'Imo Steeti.
Mmadụ ndị ahụ a tọhapụrụ na-anara ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ ngalaba nchekwa DSS dị n'Owerri.
Ka ọ dị ugbua, Onyeisi na-elekọta NYSC bụ Brigadier General Olakunle Oluseye Nafiu agaala n'ụlọọgwụ DSS dị n'Owerri ileta ndị ahụ a tọọro.
Ọ bụ ya na kọmịshọna ndị uweojii n'Imo State, Onyeisi ụlọọrụ DSS nakwa Ọchịagha ndịagha 34 artillery brigade dị n'Obinze soro gaa njem ahụ.
Ka o sinadị, Olubadan nke Ibadan bụ Oba Rashidi Ladoja ejirila ọnụ ya kwupụta na a tọhapụla ndị ntoroọbịa iri abụọ ji otu afọ efe ala nna ha a tọọrọ n'Imo state.
Olubadan mere ka anyị mata nke a n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Adeola Oloko tinyere aka na ya, nke isiokwu ya bụ "a tọhapụla ndị ntoroọbịa ji otu afọ efe ala nna ha a tọọrọ n'Imo state."
N'ozi ahụ, Olubadan mere ka anyị mata na ọ bụ gọvanọ Imo Steeti tụpenyere ya azụ gbasara nke ahụ oge ha nwere mkparịtaụka n'ekwentị.
"Gọvanọ Imo State bụ Hope Uzodimma mere ka anyị mata nke a site na mkparịtaụka ya na Olubadan nke Ibadan bụ Oba Rashidi Ladoja nwere n'ekwentị mgbe ọ kụrụ elekere ise nke mgbede taa bụ Wenezde 7 Ọktoba 2026," ka Adeola Oloko kwuru.
Cheta na anyị kọọrọ gị na ndị ntọrị tọọrọ mmadụ ruru 19, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ji otu afọ efe ala nna Nigeria a kpọrọ NYSC n'ịchafụ.
A tọọrọ ha n'Ọgbakụ dị n'Imo steeti dịka Nigeria na-emerube emume ncheta afọ 66 ha nwetara nnwereonwe n'aka mba Briten.

























