Trump ekwuola na ndịagha Amerịka ga-egbochi ọwara Strait of Hormuz

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ndịagha mmiri Amerịka ga-egbochi ụgbọmmiri ọbụla nakwa ụgbọmmiri niile ga-agba mbọ ịbata maọbụ pụọ n'ọwara Strait of Hormuz.
N'ozi o depụtara iche n'akara Truth Social, Trump gbakwunyere na mkparịtaụka ihu na ihu ha na mba Ịran nwere n'Islamabad kụrụ afọ n'ala n'ihi na Ịran adịghị njikere ịgbahapụ ọchịchọ obi ha imepụta ngwaagha nuklịa.
Cheta na mba Amerịka na Ịran dara mba inwe nkwekọrịta ka ha ga-esi kwụsị agha dị n'etiti ha, n'agbanyeghị ogologo mkparịtaụka ha nwere nke mechiri n'isi ụtụtụ Sọnde n'Islamabad, isi obodo mba Pakistan.
End of Akụkọ agha Iran
Kedụ ọnọdụ strait of Hormuz dịka nkwekọrịta Amerịka na Ịran na-amịtabeghị mkpụrụ

Ebe foto si, Reuters
Mba Amerịka na Ịran adaala mba inwe nkwekọrịta ka ha ga-esi kwụsị agha ha, n'agbanyeghị ogologo mkparịtaụka ha nwere nke mechiri n'isi ụtụtụ Sọnde n'Islamabad, isi obodo mba Pakistan.
Mba abụọ a malitere ịta ibe ha ụta maka ihe mere mkparịtaụka ha ji kụọ afọ n'ala, n'agbanyeghị na ha nọrọ awa iri abụọ na otu na-akparịta ụka ahu.
Agha dị n'etiti mba Amerịka na Izrel megide mba Ịran egbuola puku kwuru puku mmadụ, meekwa ka ọnụahịa mmanụ n'ụwa niile rịa elu nke ukwuu kemgbe ọ malitere, nke gbagoro ihe karịrị otu ọnwa ugbu a.
Ndị nnọchiteanya mba Amerịka na Ịran malitere mkparịtaụka ihu na ihu na mba Pakistan n'ụbọchị Satọde.
Tupu mkparịtaụka ahụ amalite, ndị nnọchiteanya mba Amerịka na Ịran hụrụ Praịm Minista mba Pakistan bụ Shehbaz Sharif, iji kwadoo maka nzukọ ha.

Ebe foto si, Reuters
Tupu ọ hapụ obodo Islamabad, osote onyeisiala mba Amerịka bụ JD Vance, burukwa onyeisi ndị nnọchiteanya, gwara ndị ntaakụkọ na ọ dị mwute na ha ekwekọrịtaghị. Ọ kọwara na ọdịda mkparịtaụka ahụ ga-aka emetụta mba Ịran n'ụzọ dị njọ karịa ka ọ ga-esi metụta mba Amerịka.
Vance kọwara na mba Amerịka bịara mkparịtaụka a n'obi ọcha, mana ọ dị mwute na ha na mba Ịran ekwekọrịtaghị.
Vance kelere Praịm Minista nke Pakistan na Ọchịagha Munir maka ọrụ pụrụiche ha rụrụ.
O kwuru na ọdịda mkparịtaụka ahụ abụghị mmejọ ndị Pakistan. O kwusiri ike na isi ihe Amerịka na-achọ bụ ka Ịran kwee nkwa na ha agaghị emepụta ngwaagha nuklia.
O kwuru na nke a bụ ebumnuche kachasị mkpa n'ọchịchị Trump.

Ebe foto si, Reuters
Na nzaghachi ha, mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi n'Ịran gwara Amerịka ka ha kwụsị 'ịtụ anya ihe karịrị akarị'.
Onye na-ekwuchitere ha bụ Esmail Baghaei, kọwara na o nweghị onye tụrụ anya na mba abụọ a ga-ekwekọrịta ozugbo n'otu nzukọ ahụ.
Baghaei kọwara na mkparịtaụka ahụ mere n'oge obi abụọ jupụtara n'etiti mba abụọ a.
Ọ gwara ụlọmgbasaozi no n'Ịran na o nweghị onye nwere uche tụrụ anya na mba abụọ ahụ ga-ekwekọrịta n'otu nzukọ ahụ.
Mba Amerịka na Ịran amalitela inwe mkparịtaụka udo n'Islamabad,islam Isiobodo Pakịstan

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka, mba Ịran na mba Pakịstan amalitela inwe mkparịtaụka na Islamabad bụ isiobodo Pakịstan.
Ndị nnọchiteanya mba Amerịka na Ịran na Praịm mịnịsta Pakịstan bụ Shehbaz Sharif nwere mkaprịtaụka na mbido.
Dịka mkparịtaụka a na-aga n'ihu, Onyeisiala Donald Trump kwuru na enweghị uru ọbụla mba Ịran ga-erita n'agha a.
Atụmatụ udo agbaala n'anwụ mana enwebeghị nkwekọrịta ọbụla enwere.
A na-atụ anya mpụtara mkparịtaụka a n'oge adịghị anya

Ebe foto si, Getty Images
Trump ekwuola na Ịran anaghị erube isi nye nkwekọrịta ha nwere banyere Strait of Hormuz

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump boro Iran ebubo na ọ ha metọrọ ma ghara irube isi na nkwekọrịta ha nwere gbasara Strait of Hormuz.
Okwu ndị a na-egosipụta ụdo na-adịghị ike nke nkwekọrịta nkwụsị ọgụ ahụ, na akụkọ na-egosi esemokwu banyere ihe a gụnyere na nkwekọrịta ahụ.
Ọ bịara dịka praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na gọọmentị ya na Lebanọn ga-amalite inwe mkparịtaụka banyere ịnapụ Hezbollah bụ otu ndịagha Ịran na-akwado Iran ngwaagha ha ma malite mmekọrịta udo.
Otu onye ọrụ gọọmentị Amerịka kwuru na a ga-enwe mkparịtaụka n'izuụka na-abịa na Washington isiobodo Amerịka banyere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ n'etiti Lebanọnọ na Izrel.
Ndị ọrụ Lebanọn akpọọla oku ka a kwụsị ọgbaghara tupu mkparịtaụka ahụ amalite, mana Netanyahu kwuru na "Enweghị nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ na Lebanon."
Trump kwuru na Izrel ga-akwụsịtụ ime mwakpo ha na mba ahụ iji kwado atụmatụ na mkparịtaụka udo.
Mwakpo ahụ e mere na Tọzde bụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ bi na mpaghara ndịda Beirut bụ isiobodo Lebanọn hapụ ụlọ ha.
Onyeisi ụlọọrụ World Health Organization (WHO) bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus wepụtara ozi na X ma kwuo na mwakpo ahụ metụtara mpaghara Jnah nke nwere ụlọọgwụ abụọ.
O kwuru na ka ọ dị ugbua, enweghị akụrụngwa ọbụla a ga-eji leta ndị ọrịa 450 si ụlọọgwụ abụọ ahụ gụnyere ndị ọrịa ICU. Ọ kọwara na nke a bụ ihe na-echere ha aka mgba.

Ebe foto si, Getty Images
Mwakpo ahụ Izrel wakporo Lebanọn bụ nke kachasị ha mere na kemgbe agha ahụ malitere n'izuụka isii gara aga nke mere ka Ịran kwuo na Izrel na-emetọ iwu nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ha nwere ma gbochie ụgbọmmiri bu ibu ịgafe na Strait of Hormuz ma kwuo na ha ga-emegwara.
Trump wepụtara ozi na Truth Social ya banyere mmechi ọwa mmiri ahụ bụ ebe e si ebubata mmanụ agbidi pasenti 20 nke mbaụwa.
"Enwere akụkọ na Iran na-ana ndị ụgbọmmiri na-agafe na Hormuz Strait ụgwọ," ka o dere. "Ọ ka mma ka ha ghara ime ya, mana ọ bụrụ na ha na-eme ya, ọ ka mma ka ha kwụsị ya ugbua."
Ndịagha Izrel na-aga n'ihu na-eweghara nnukwu akụkụ ndịda Lebanọn, ebe ha bibiri obodo na nso nso a. Ka ọ dị ugbua, enweghị onye ma ka mkparịtaụka ịkwụsị ịkwa mgbọ a a ga-amịta mkpụrụ ọbụla.
A mabeghịkwa etu Lebanọn na ndị mba Izrel ga-esi kparịta ụka, ga-sie metụta Hezbollah, nke n'agbanyeghị na ha nwere ndị nnọchiteanya na gọọmentị Lebanon bụ ụlọọrụ dị iche nke mba Ịran na-akwado.
Gọọmenti Lebanon machiri ọrụ ndịagha Hezbollah na mbido ọnwa Maachị, n'ụbọchị ole na ole ka agha ha na Izrel malitere, mana o gbochighị ndị otu ahụ ịrụ ọrụ agha.
Kedụ ihe mere e ji kpụrụ Strait of Hormuz n'ọnụ?
Ọwara Strait of Hormuz abụrụla isi ihe akpụ n'ọnụ n'agha US na Israel na Iran ka Tehran mechiri ọwara mbupu nke ọma.
Ihe Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump chọrọ maka nkwụsị nkwakarịta mgbọ nke izu abụọ dabere na Tehran imeghe ụzọ ahụ - nke e kwere na nkwa.
Agbanyeghị na n'ụbọchị Tọzde 9 Epreelụ 2026 ka Trump boro Iran ebubo imebi nkwekọrịta ịkwụsị nkwakọrịta mgbọ ha nwere ma kwuo na ọ "na-arụ ọrụ na-adịghị mma" nke ikwe ka mmanụ gafere na Strait nke Hormuz.
N'okwu izizi ya na saịtị mgbasa ozi mmekọrịta ya bụ Truth Social ọ dọrọ Iran aka na ntị "ka mma ka ọ ghara ịna-ana ndị na-ebu ụgbọ mmiri ụgwọ" na-agafe n'okporo ụzọ mmiri dị mkpa.
BBC Verify chọpụtara na opekatampe ụgbọ mmiri itoolu gafere n'akụkụ mmiri ahụ kemgbe e kwuputara nkwụsị ịkwakọrịta mgbọ.
Tupu agha ahụ, ihe dịka ụgbọ mmiri 128 na-agafe ebe a na-akpagbu kwa ụbọchị.
Praịm Minista Keir Starmer nke Briten agwala Trump okwu banyere mkpa ọ dị maka atụmatụ bara uru iji nweta mbufe ụgbọ mmiri mgbe ọ gachara UAE, Bahrain, Qatar na Saudi Arabia iji gosi mkpa ọ dị ịmalitekwa azụmahịa ụzọ ahụ ọzọ.
International Maritime Organisation na-ekwu na ọ na-akwado ndị ọrụ ụgbọ mmiri 20,000 na mpaghara ahụ - ọtụtụ n'ime ha ka tọrọ n'ụgbọ mmiri na-enweghị ike isi n'ọdụ ụgbọ mmiri ahụ pụta.
Ka ọ dị ugbua, ọnụ ahịa mmanụ mba ụwa na-eme ihere nke $100 otu gbọmgbọm ka ọnụ ahịa dakwasịrị na-esochi ọkwa nkwụsị ọkụ.

Na Tọzdee, ndị ụlọ ọrụ Lebanon gwara ndị ọrụ nchekwa gọọmentị ka ha machibido ngwa ọgụ na Beirut nye naanị ndị ụlọọrụ steeti.
Praịm mịnịsta Lebanọn bụ Nawaf Salam kwuru na njedebe nke nzukọ ndịisi na a na-arịọ ndịagha na ndị nchekwa ka ha bido ngwa ngwa irube isi nye iwu ahụ gọọmenti nyere.
Ụlọọrụ Netanyahu kwuru na Izrel "kelere oku ahụ Praịm mịnịsta Lebanọn kpọrọ banyere ngwaagha dị na Beirut".
O kwuru na mkparitaụka dị n'etiti mba abụọ a ga-elekwasị anya na "ịnapụ Hezbollah ngwaagha ọbụla ma hiwe atụmatụ udo n'etiti Izrel na Lebanọn.
Akwụkwọozi ụlọọrụ Axios mba Amerịka, kwuru na okwu Netanyahu na-abịa dịka ya na Onyeisiala Trump na Steve Witkoff nwere mkparịtaụka.
Akụwkwọozi ahụ kwuru na otu onyeisi gọọmenti gwara ha na mkparịtaụka ahụ ga-amalite na Washington n'izuụka na-abịa.
Onyeisiala mba Lebanọn bụ Joseph Aoun kwuru na ọ bụ naanị nkwekọrịta udo ga-akwụsị esemokwu ahụ dị na Lebanọn.
Aoun akpọọla oku ka ya na Izrel nwee mkparịtaụka n'ọnwa gara aga dịka ụzọ isi kwụsị esemokwu dị n'etiti ha na Hezbollah ma katọọ otu ahụ Ịran na-akwado.
Esomokwu ahụ malitere dị n'etiti Izrel na Hezbollah malitere oge otu ahụ tụrụ ogbunigwe n'Izrel na nzaghachi ogbugbu e gburu onyendu kachasị mba Ịran Ayatollah Ali Khamenei.
Ihe karịrị nde mmadụ 1.2 agbapụla n'ụlọ ha n'ihi agha a.



























