Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ịmanye ndị ohi ịgba egwu nke na-ewu ewu na soshal midia ugbua
Nke na-ewuzi ebe niile na Naịjirịa ugbua bụ na ọ bụrụ na e jide onye ohi, a na-agbanyere ya egwu ka ọ gbawa, ma gbatee ya aka.
Mgbe mbụ, ọ bụrụ na e jide onye ohi n’ahịa ma ọ bụ n’ogige ebe ndị mmadụ bi na ya, ha na-agbakọ ọnụ tie onye ohi ahụ ihe tinka tiri pan tupu e nyefee ya n'aka ndị uweojii.
Ọtụtụ mgbe ọha mmadụ na-etigbu ndị ohi, mụọ ha ọkụ mana ugbua ihe agbanweela, nek bụ na a na-asị ndị ohi e jidere gbawa egwu.
Kedụ ihe kpalitere nke a?
Otu onye bụ Mazi Obinna bi n’Abakpa Enugwu Steeti kwuru na ọ dị ya ka ọ bụ na soshal midia ka ndị mmadụ hụrụ ya bụ ihe mbụ, onye ọbụla wee malite iṅọmie akparamagwa ahụ.
Mazi Obinna kwuru na ha jidere ndị ohi ụzọ abụọ n’ime ọnwa Sepụtemba 2026 n’ahịa Abakpa.
Ihe ha mere bụ ịgbanyere ha egwu Ogene na Highlife ha wee gbajuo ya afọ tupu ndị uweojii abịa kpụrụ ha.
Mazi Chidi Agu, onye ọrụ Bekee kwuru na o chere na ihe kpatara ya bụ n’ihi ka obodo siri jọọ njọ ugbua, na ndị mmadụ ahụla na ọtụtụ mgbe ọ bụ agụụ na enweghị ọrụ na-akpata ụfọdụ ji ezu ohi.
Maazị Agu kwuru na ya kwadoro kama ọha mmadụ ga-agbakọ ọnụ tigbuo onye ohi, na ọ ka mma ka ha tinyere ya egwu ma ọ bụ nye ya ntaramahụhụ ikpochasị gburu gburu ebe ahụ ọ nọ zuo ya bụ ohi.
Site na Legọs, bia n’Enugwu, Imo, Anambra n’ebe niile na Naijiria onye ọbụla zuru ohi e wee jide ya, ga-agbariri egwu tupu enyefee ya n’aka ndị Uweojii. Ma ị maara agba ma ị maghị agba nke ahụ agbasaghị ndị jidere gị.
Kedụ ihe iwu kwuru banyere nke a?
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra bụ Tochukwu Ikenga rịọrọ ndị mmadụ ka ha gbaa mbọ kwụsị ịsị ndị ohi gbawa egwu kama ha were ha nyefee n’aka ndị Uweojii ozugbo ozugbo maka na ọ bụ ọrụ ha ime nnyocha ma taa ha ahụhụ iwu kwuru.
O kwuru na ndị ọha iji aka ha enye onye ohi ntaramahụhụ ọbụla nke gụnyere ịgba egwu, ịza okporoụzọ maọbụ iti ihe megidere iwu Naịjirịa.
O kwuru na ọ bụ oke na ọrụ dịịrị ndị uweojii ime nnyocha ma taa ndị ohi ahụhụ dịka usoro iwu si kwadoo.



