Iwu Naịjirịa ọ kwadoro ndị na-aghọ nwa n'ụzọ ọdịnaala?
Ọ kwa ị nụrụ na aka ndị uweojii akparala otu nwaanyị na-aghọ nwa a kpọrọ Onyinyechi Esther Charles n'Anambra Steeti, maka ebubo na ọ na-awa ụmụnwaanyị dị ime afọ na-ebughị ụzọ nata ọzụzụ maka nke ahụ?
Kedụ ndị bụ ọghọ nwa Bekee kpọrọ Traditional Birth Attendant, ha nwere ikike ịwa nwaanyị dị ime afọ?
Ọghọ nwa bụ onye ọrụ ahụike na-enyere ụmụnwaanyị dị ime aka oge ime na-eme ha, oge ha na-amụ nwa nakwa oge ha mụchara nwa. Ụfọdụ ha na-amụta ọrụ a site n'ihe ndị ha ji anya hụ ma jiri aka kụziere onwe ha maọbụ ịmụ ọrụ n'aka mmadụ karịa ịgụ ihe ọmụmụ ahụike n'ụlọakwụkwọ.
E nwekwara ụlọ ọmụmụ nwa Bekee kpọrọ 'Maternity Homes', nke bụ ebe ụmụnwaanyị dị ime na-aga maka inweta ezi nlekọta ahụike nakwa ịmụ nwa. Ha na-enye aka n'ime ime obodo ebe ụlọọgwụ na-anọghị nso.
Mana, ọ bụ gịnị ka iwu Naịjirịa kwuru gbasara ụlọ ọmụmụ nwa?
Na Naịjirịa, steeti niile nwere iwu na-achịkọta ụlọ ọmụmụ nwa nakwa ọrụ ndị ha na-arụ. Iwu ndị a kwupụtara na ụlọ ọmụmụ nwa niile ga-anata nkwado gọọmenti, nweta ikike ma nweekwa ọghọ nwa nke otu Nursing and Midwifery Council of Nigeria kwadoro.
Iwu Nursing and Midwifery Council of Nigeria (NMCN) kwuru na ọ bụ naanị ndị nọọsụ na ndị ọghọ nwa nwereike ịrụ ọrụ maọbụ lekọta ụlọ ọmụmụ nwa.
Mịnịstrị ahụike kwuru na ndị na-aghọ nwa n'ụzọ ọdịnaala ga-edebarịrị aha ha ma natakwa ezigbo ọzụzụ iji ghara itinye ndụ nne na nwa n'ihe ize ndụ.
Iwu ndị a kwukwara na ọ bụ arụ mmadụ ihiwe ụlọ ọmụmụ nwa na-ebughị ụzọ nata nkwado gọọmenti maọbụ were ndị ọrụ na-enweghị ezi ọzụzụ.
Ọzọ a bụrụ na ụlọ ọmụmụ nwa enweghị ikike ịwa nwaanyị dị ime afọ, maọbụ kanye ya mma n'ahụ oge ọ na-amụ nwa.
Ha enweghịkwa ikike ịghọ ụmụ ejima, nwa ji ụkwụ na-apụta, maọbụ nwa nne ya nwere ọbara mgbali elu.
Nke ọzọ abụrụ na ụlọ ọmụmụ nwa enweghị ikike ịgba nwaanyị dị ime ọgwụ mgbu ndị siri ike, iji ọgwụ akpalite ime omume maọbụ ịgbanye nwaanyị dị ime mmiri n'akwara nke Bekee kpọrọ drip ma ọ bụrụ na o nweghị ọghọ nwa maọbụ dọkịta nọ nso.
Ọ bụ gịnị meziri ụfọdụ mmadụ ji aga n'aka ndị ọghọ nwa ndị a?
Nke bụ bụ na ha dị ọnụ ala ma dịkwa mfe karịa ụlọọgwụ, ụfọdụ n'ime ha na-eji ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ elekọta ụmụnwaanyị dị ime, ebe oge ụfọdụ kwa, ọ bụ naanị ha na-arụ ọrụ ịghọ nwa n'ime obodo ebe ndị ọ na-ara ahụ ịhụ dọkịta maọbụ ndị nọọsụ.
Mana ọ dị mkpa na ị ga-agbado anya dịka nwaanyị dị ime, tupu ị gaa n'ụlọ ọmụmụ nwa ọbụla, ka ọ ghara na ịbụ na ị gara ịnyụ anyụ, zọrọ azọrọ.



