You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị Iswap si gbuo mmadụ 29 n'Adamawa Steeti
Ndị ojiegbe egbuola opekatampe mmadụ 29 n'obodo Guyaku dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Gombi n'Adamawa Steeti oge ha wakporo ọgbọ egwuruegwu ebe ndị mmadụ gbakọrọ ma gbaa egbe aghara aghara.
Ndị ọchịchị na ndị obodo kwuru na ndị ojiegbe ahụ gara n'ihu mụnye ụlọ ndị mmadụ ọkụ, tinyere ụlọ okpukperechi dị iche iche nakwa ọgbaatumtum ndị mmadụ.
Otu Islamic State na-eyi ndụ egwu a maara dịka (ISWAP) apụtala kwuo na ọ bụ ha kpara mkpamkpa ahụ, mana ha ekwupụtaghị ihe bụ iwe ha.
Ka ọ dị, aka na-achị Adamawa Steeti bụ Gọvanọ Ahmadu Umaru Fintiri ewepụtala foto dị iche iche gosiri oge ọ gara na mpaghara ahụ, dịka ọ kọwara ya bụ mwakpo ka "mmetọ ihe e ji bụrụ mmadụ".
Ozi si n'ụlọọrụ Gọvanọ Fintiri kwuru na e mere mwakpo ahụ ruo ọtụtụ elekere, ebe ndị mmadụ ka chị obi ha n'aka ma na-erukwa uju, dịka ọtụtụ mmadụ gbahapụrụla ụlọ ha n'ihi ụjọ na e nwereike ime ha mwakpo ọzọ.
N'ozi o wepụtara n'akara X, Gọvanọ Fintiri kwuru na ha na-agbasi mbọ ike ime ka ndị nchekwa weghachi udo, iji hụ na mmadụ niile lọghachiri n'ụlọ ha ọzọ, ma nwee obi iru ala.
E jighị mwakpo mara Adamawa Steeti mana mpaghara northeast ọ nọ n'ime ya ahụtala mwakpo otu dị iche iche na-eyi ndụ egwu, bụ ndị ha na otu ISWAP nwere njikọ.