Ụlọnnọchiteanya Nigeria enyela iwu ka a ghara ịgbanwe atụmatụ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway

Ebe foto si, Federal Ministry of Works
Ụlọ nnọchiteanya nke Nigeria agwala Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ ka ha mee nnyocha banyere atụmatụ ha wepụtara ọhụrụ maka ịgbanwe usoro okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway, ma kwuo ka ha laghachi n'atụmatụ mbụ e ji hazie ọrụ ahụ.
Ndị omeiwu ahụ mere mkpebi a mgbe ha tụlere atụmatụ mgbanwe ụzọ ahụ na mmetụta o nwereike ịbute n'obodo ndị dị n'akụkụ osimiri.
Ha kwuru na mgbanwe ahụ nwereike imebi atumatu mbụ nke okporoụzọ ahụ, ma ọ bụrụ na e nyochaghị ihe gbasara gburugburu ebe obibi, ọdịmma ndị mmadụ na ego niile a ga-emefu n'ọrụ ahụ nke ọma.
Cheta na minista na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi kwuru na ihe ọhụrụ gọọmenti chọrọ ime banyere akporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway bụ ịgbakwụnye ọrụ okporoụzọ East-West Road.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ụlọomeiwu nta ahụ kpokwara oku ka e nyefee akwụkwọ nnyocha mmetụta ọrụ ahụ ga-enwe na gburugburu ebe obibi nke akpọrọ 'Environmental Impact Assessment (EIA)' n'asụsụ Bekee n'aka Kọmitii ga-enyocha ya tupu ọrụ amalite.
Mkpebi a bịara n'oge e bidoro ịnụ kepukepu gbasara mgbanwe a chọrọ ime n'atụmatụ okporoụzọ ahụ.
Na nkọwa ya, Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Dave Umahi, kwuru na nrụzigharị East-West Road site na Edo ruo Cross River bụ ọrụ ọzọ dị iche, nke na-agaghị emetụta atụmatụ mbụ e si arụ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway.




























