You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Covid-19: Ihe Naijiria na-eme maka nje coronavirus ọhụrụ a hụrụ
Ngalaba na-ebu agha megide mfesa ọrịa bụ 'Nigeria Centre for Disease Control(NCDC) ekwuola na otu onye ebutela nje coronavirus na Krọs Riva steeti ma kwuọ na a na-achọ ndị ya na nwoke ahụ jekọrọ iji gbochie ọrịa ahụ ifesa.
N'akwụkwọ ozi NCDC wepụtara n'abalị Tuzde nke onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Dr. Jide Idris binyere aka, ụlọọrụ ahụ kwuru kpọnkwem na "e nwere otu onye were anya na o butela Covid-19" bụ onye e dowere iche ma na-elekọta ya dịka atụmatụ nleta nke Gọọmentị Etiti haziri.
NCDC gara n'ihu kwuo na ha na Ministri ahụike nke Krọs Riva ejikọro aka na ịchọ ndị ha na onye ahụ bu nje Covid-19 jekọrọ iji gbochie nkesa ọrịa ahụ.
"Esochiela ndị a matarala n'ime ha, o nweghị ihe akaebe gosiri na ọrịa efesaala ugbua.."
Komishọna na-elekọta ministrị ahụike Riva Steeti ahụ bụ Dkta Henry Ayuk gwaburu ndị ntaakụkọ na e nwere nwoke Chaina gbara afọ 53 ha na-enyo na o bu nje Covid-19.
Ọ gara n'ihu rụtụ aka na e dowere nwa amadi ahụ iche n' ụlọọgwụ 'University of Calabar Teaching Hospital', maka nleta.
Ihe ọrịa Covid-19 furu Naijirịa
- Naijiria nwere nje Covid-19 ya mbụ nabalị 27 nke ọnwa Febụwarị afọ 2027 dịka otu nwoke bụ nwaamala Itali bịara na Legọs.
- Gọọmentị gbachie ụfọdụ obodo mepere emepe dịka Legọs, Ogun nakwa Abuja n'ọnwa Maachị afọ 2020 dịka gọọmentị gbaliri igbochi nkesa ọrịa ahụ.
- Mmadụ karịrị puku atọ(3,000) nwụrụ ebe ihe karịrị 200,000 butere ya.
- Ndị nwere agba nwụrụ site n'ọrịa covid-19 gụnyere Abba Kyari (nwanne Muhammadu Buhari) Abiola Ajimobi(bubu gọvano Oyo steeti), Yinka Odumakin(ọgba mbọ maka ikike dịịrị onye),Dan Foster(ọgwakọ egwu).