A chọpụtala na Pope nwere 'cancer' na ngụgụ ya - Vatican

Ebe foto si, Getty Images
Vatican ekwuola na a chọpụtara na Pope Leo XIV nwere kansa na ngụgụ ya, mana a wara ya ahụ gara nke ọma iji wepụ mpaghara ala nke ngụ aka nri ya.
Pope dị afọ iri asaa na otu (71) wara ahụ nke were nkeji iri itoolu (90) n'ụlọọgwụ Gemelli Hospital dị na Rome n'ụbochị Tuzde 13 Ọktoba 2026.
Ka e mechara, e nyochara ya ma chọpụta na ngụgụ ya nwere nje a kpọrọ adenocarcinoma.
"Ịwa ahụ ya gara nke ọma, ma e nweghịkwa ihe ọjọọ dapụtara n'ime ya. Oge ọ wachara ahụ, Pope tetere nke ọma ma laghachi n'ime ụlọ ya ka e lebachaara ya anya" ka Vatican kwuru.
Pope Leo XIV: "Ahụ a wara ya iwepụ akpụ 'nodule' dị na ngụgụ ya gara ọfụma"

Ebe foto si, Getty Images
Isiụlọọrụ ụka Katọlik bụ Vatican dị na Rome kwuru na ahụ a wara Pope Leo XIV iji wepụ obere akpụ dị na ngụgụ ya a kpọrọ 'localized nodule' gara ọfụma.
Ozi si n'aka ndị mgbasaozi Holy See na mgbede ụbọchị Tuzde 13 Ọktoba kwuru na Pope alaghachịla n'ọnụ ụlọọgwụ Gemelli.
Cheta na Pope wepụtaburu ozi sị na a ga-awa ya ahụ ma kwuo ka ndị mmadụ tinye ya n'ekpere.
Pope Leo XIV kwupụtara na ndị dọkịta ya hụrụ obere akpụ na ngụgụ ya bụ nke ha ga-eji waa ya ahụ n'abalị ole na ole na-abịa abịa.
N'okwu ya dịka ọ duru ekpere 'Angelus' Ụbọchịụka, Pope Leo gbara afọ 71 kwuru na "a hụrụ akpụ ahụ n'oge ọ nọ naanị otu ebe", ma kwuo na ndị dọkịta gwara ya na ọ bụ ahụ ka a ga-awa ya.
Pope kwuru sị, "Ndị enyi m, oge m mere nnyocha ahụike na nsonso a, ndị dọkịta hụrụ obere akpụ na ngụgụ m.
"Ha hụrụ ya n'oge, ọ dịkwanụ n'otu ebe."
"Ndị kwenyere na ọka mma igbo ọgụ ahụ, ya mere, n'ihi ndụmọdụ ha nyere m, ekpebiela m ịga maka ịwa ahụ ka e wepụ ya n'abalị ole na ole na-abịa abịa."
Pope Leo gara n'ihu rịọ nkwado ekpere.
Ama Pope Leo gbara banyere ọnọdụ ahụike ya na-abịa ihe dịka otu afọ na ọkara ọ nọchiri Pope Francis lara mụọ bụ onye nwekwara nsogbu ngụgụ bụ nke ọ gara ụlọọgwụ.
Gịnị bụ 'localised nodule' o kwuru maka ya?

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba ahụike a kpọrọ National Cancer Institute kọwara 'nodule' dịka, "akpụ nke nwere ike bụrụ kansa maọbụ ọ bụrụ akpụ nkịtị."
Ha ekwughị ihe na-akpata ya.
Dọkịta ezinaụlọ bụ Dr Victor Dike gwara BBC na "ọtụtụ ndị mmadụ nwere (nodules) na ngụ ha. Mgbe ụfọdụ a na-ahụkarị ya ma ndị mmadụ gaa ime nnyocha X-ray maọbụ CT-Scan maka ihe ọzọ."
O kwuru na 'nodule' nke Pope dị 'localised' na-arụtụ aka na o nwere ike ọ gaghị abụ kansa.
Dr Dike, onye bụ Onyeisi otu ọrụ ahụike 'Medical Excellence Foundation For Africa' kwuru na ọ bụ etu akpụ ahụ ha nakwa ihe ndị ọzọ a ga-enyocha ga-ekwu ma ọ bụ kansa ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ.
Dr Dike kwuru na ọ bụrụgodị na ọ bụ kansa, na a ga-awali ya ahụ wepụ ya, o nwere onwe ya n'ihi na ọ ka nọ otu ebe.
























