Ezinaụlọ na ndị agbataobi kọwara ndụ 'Azia' tupu e gbuo ya

Aha onyonyo, Ezinaụlọ na ndị agbataobi kọwara ndụ 'Azia' tupu e gbuo ya
Ezinaụlọ na ndị agbataobi kọwara ndụ 'Azia' tupu e gbuo ya
Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii ekwela nkwa na ha ga-ejide ndị omekome gbagburu mmadụ abụọ n'Akwa n'Anambara steeti na mgbede Sọnde abalị iri atọ nke ọnwa Ọgọst 2026.

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị ojiegbe bu ụgbọala Toyota Corolla gbagburu mmadụ abụọ ndị ahụ.

Ndị ojiegbe kpara mkpamkpa ahụ n'ebe abụọ gụnyere okporoụzọ S.M. Okeke dị n'Amaikwo nakwa Capital City Road n'Amaenyi, Akwa Anambara steeti.

Otu onye na ndị e gburu gụnyere Isaac Nwosu a maara dịka 'Azia'.

Ndị uweoji kwukwara na ha amaghị ndị ojiegbe ahụ. Ha sị na ha amaghịkwa onye nke abụọ a gbara egbe ma gbuo n'ụbọchị ahụ.

Kọmịshịọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnanna Oji Ama mere ka a mata nke a n'oge ọ gara mgbaru iji tie ezinaụlọ Isaac Nwosu aka n'obi ma nwee mkparịtaụka maka ọnwụ nwaamdi ahụ.

Oji Ama katọrọ ihe mere ma ibuso ọnọdụ enweghị nchekwa na steeti ahụ. Ọ kọwara ọnwụ Isaac Nwosu dịka nnukwu ọdachi ma tuo mbọ niile ọ gbara na ngalaba igbasa ozi udo mgbe ọ dị ndụ.

N'aka nke ọzọ, nwa Isaac Nwosu nwụrụ anwụ bụ Ugochukwu Nwosu kwupụtara n'akara soshal midịa ya na nna ya bụ onye udo.

Ugochukwu kọwakwara ya dịka onye na-alụrụ ndị ọzọ ọgụ ma kwuo na ọtụtụ ezinaụlọ bi n'udo taata maka na nna ya tinyere ọnụ ma wetere ha udo.

N'okwu Ugochukwu Nwosu "na mbụ na ndụ m, ebela m akwa anya mmiri ataa m n'anya".

Kenechukwu Chukwudi so na ndị na-eri uju kọwara udiri mma Isaac Nwosu bụ. N'okwu ya "Ọ bụ ihe nwute ka anyị si nụ ọnwụ Isaac. Isaac bụ otu onye Obodo Awka ji biri".

"Ọ na-akpa ndị mmadu ọchị. Oge ọbụla a na-eme mmemme ị hụ Isaac, obi ka adị gị mma maka na ọ ga-ekwulili ihe ga-atọ gị ọchị".