Ihe m ji echeta 'Clarus' nna m - Uche Offor

Ihe m ji echeta 'Clarus' nna m - Uche Offor
    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

Uche Offor bụ nwa Rev. Davis Offor, onye a ma ama dịka 'Clarus Mgbeojikwe' n'ejije New Masquerade e gosipụtara n'ụlọmgbasa ozi Nigerian Television Authority (NTA) n'afọ ndị 1980, akọwaala etu nna ya siri bie ndụ na oge ikpeazụ ya.

Offor kwupụtara nnukwu nwute nke ezinaụlọ ya na-agabiga ugbua n'ihi ọnwụ nna ya, kwuru na nna ya nwụrụ oge ọ gbachara afọ iri asatọ na ise.

Ọ kọwara nna ya 'Davis Offor' dịka nwoke nwere obi umeala na onye Chukwu gọziri agọzi nke ukwuu.

N'okwu ya, "Aga m ekwu na kemgbe m na-eto n'ụwa, nna m bụ otu onye m hụrụla kacha nwee ezi omume na ndụ. O nwere ezi omume ruo n'isi, n'ime mmụọ, n'anụ ahụ na n'uche."

Dịka o siri kwuo, nna ya bụ a mụrụ n'Okpoton dị n'okpuruọchịchị Bende n'Abịa Steeti ma bụrụkwa osote ọkpara nna ya.

"A mụrụ ya n'afọ 1941. Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ndị ụka nwee. Mgbe ọ gachara akwụkwọ ka ọ malitere ime ejije tupu anya amalite inye ya nsugbo, o nwee kwụsị ime ejije n'afọ 1993,"ka o kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na: "Kemgbe ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ụka bụ nke ọ hụrụ n'anya nke ukwuu. O nwere mkparịtaụka ebe o kwuru na ọ naghị ewute ya na ọ hapụrụ ime ejije ma na-arụ ọrụ ụka. Ọ bụkwa otu o si jiri obi ya niile tinye n'ihe ịkpa ọchị ka o si tinyekwa obi ya niile na-ife Chineke ya."

Skip Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a and continue readingLee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

Offor kwuru na obi dị ezinaụlọ ya ụtọ nke ukwuu n'ihi na ha mụtara ọtụtụ ihe n'aka ya. O kwukwara na ezinaụlọ ya na-ekpe ekpere ka Chineke gbaa ha ume ka ha wee gaa n'ihu na-eme ihe ọma dịka nna ha mere mgbe ọ dị ndụ.

Offor kwuru na nna ya lụrụ nwaanyị mana nwunye ya anwụọla.

"Nwunye ya bụ Odoziakụ Juliet Offor nwụrụ n'afọ 2018. O nwere ụmụnwoke anọ na otu nwaanyị. O nwekwara ụmụ ụmụ. O bụghị ihe dị mfe mmadụ ilekọta ezinaụlọ ya ma na-eme ejije maka na anyị anaghị ahụ mgbe ụfọdụ n'ihi na ọ na-esi n'otu ebe ime ejije nke a gaa n'ọzọ," o kwuru.

Dịka o kwuru "Ọ gbara mbọ nke ọma n'agbanyeghị na nkweghị ya n'ihe banyere okpukperechi dịkwa iche. O kwenyere nke ukwuu n'okike na-ejere ụmụ mmadụ ozi, ị na-ekpere ụwa ekpere ya na ị na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka. Ọ bụghị ụdị okpukperechi nke a na-ebutere onye ụkọchụkwụ osikapa maọbụ ọkụkọ, mba. Ọ bụ ya n'enye enye."

Offor kọwara na nna ya malitere ọrụ ụkọchukwu mgbe ọ bụ nwatakịrị n'ihi na nna ya gwara ya na ọ bụ akara aka ya na Chineke chọrọ iji ihe ịkpa ọchị bupụta ya n'ihu ọha mana ọrụ ya dịka ụkọchukwu nyere ya obi ụtọ nke ukwuu.

Ọ gbakwunyere na nna ya bụ onye kụziri ya ọtụtụ ihe ma bụrụkwa ihe ịmaatụ na nwoke anaghị ahụ ụzọ mana ọ nọsiri ike ọtụtụ afọ.

"Ọtụtụ oge ọ na-anọ naanị ya. Ọ na-eje aka ya asa akwa ya. O siri ike mmadụ agbanyeghị ọnọdụ anya maọbụ ahụike ya. O nwere obi agụ," ka o kwuru.

Offor kwuru na ezinaụlọ ya e kwupụtabeghị mgbe ha ga-eme olile ozu nna ha bụ Davis Offor.