Ihe mere m ji akatọ City Boy Movement, Obi Cubana na Cubana Chiefpriest - Chidi Mike Anyanwu

Aha onyonyo, Ihe mere m ji akatọ City Boy Movement, Obi Cubana na Cubana Chiefpriest - Chidi Mike Anyanwu
Ihe mere m ji akatọ City Boy Movement, Obi Cubana na Cubana Chiefpriest - Chidi Mike Anyanwu
    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Onye ji ego achụ ego bụ Chidi Mike Anyanwu a maara dịka Chidi Mike Cars, ekwuola ihe mere o ji akatọ City Boy Movement nakwa nhọpụta a họpụtara Obinna Iyiegbu a maara dịka Obi Cubana nakwa Pascal Chibuike Okechukwu e ji Cubana Chiefpriest dịka ndịisi otu ahụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa n’Imo Steeti n’otu n’otu.

Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka, Chidi Mike kwuru na ọ bụ maka ajọ ọnọdụ Naịjirịa mere o ji akatọ otu City Boy Movement nakwa nhọpụta Obi Cubana na Cubana Chiefpriest dịka ndịisi n’otu ahụ.

N'okwu ya "Mmekọ dị n'etiti mụ na Obi Cubana na Cubana Chiefpriest dị ka mmekọ ụmụnne atọ. Ụmụnne m na-eme City Boy m kpọọ ha gwa ha na City Boy adịghị mma."

O kwuru na obi adịghị ndị Naịjirịa mma ugbua maka ihe isi ike, ajọ ọchịchị, ajọ ọnọdụ nchekwa a na-enwe na Naịjirịa taa.

Ugbua, Chidi Mike na-azọ ọkwa ịnọchiteanya mpaghara Isiala Mbano, Okigwe, Onuimo n'ụlọnnọchiteanya etiti Naịjirịa.

"Ihe mere m ji chọọ ịzọ ọkwa a bụ maka na ndị Igbo achọghị ikwu okwu. Obi nwanne anyị nwere dị nnukwu. Anyị anaghị agwa ndị ji ọchịchị eziokwu n'ihi na anyị achọghị ka o metụta ihe anyị na-eme," bụ ihe Chidi Mike kwuru.

O kwuru na ya nwere oke ịhụnanya n'ebe mmadụ ibe ya nọ karịa ego ma kwuokwa na ọ hụrụ ụmụ Igbo n'anya, ọ bụ nke a mere o ji azọ ọkwa a.