Olee ndị bụ mmadụ 48 Gọọmenti Naịjirịa kwuru na ha na-akwado iyi ndụ egwu?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọchịchị Naịjirịa ewepụtala aha mmadụ iri anọ na asatọ (48) na ụlọọrụ iri na abụọ (12) ndị a na-ebo ebubo na ha na-akwado iyi ndụ egwu.
Ihe ndekọ ahụ e wepụtara n'ụbọchị Fraịde ewepụtaghị ozi rijuru afọ gbasara ndị a kpọrọ aha. Ọ kpọghị aha mba ha, ogogo ha jiri tinye aka n'iyi ndụ egwu maọbụ otu ndị e boro ebubo na ha na-akwado.
Ozi ahụ enweghịkwa ihe nkọwa doro anya, dịka onyonyoo, foto maọbụ ụdị ekere ndị e boro ebubo.
N'oge gara aga ka Naịjirịa wepụtara ụdị ntaramaahụhụ a ga-enye ndị tinyere aka n'iyi ndụ egwu, nke na-agbasokarị ụkpụrụ kọmitii nchekwa nke otu mbaụwa, gụnyere ijichi ngwongwo na ịmachi njem.
Naịjirịa hiwere otu ga-ahụ maka ntaramaahụhụ site n'iwu gbochiri iyi ndụ egwu e mere n'afọ 2022, iji tinye ụkpụrụ otu UN n'ọrụ.
Kọmitii ahụ na-emejupụta ntaramahụhụ ndị metụtara ego, nke ebumnobi ya bụ ime ka ego ghara irute mmadụ maọbụ otu ọbụla nwere ihe jikọrọ ha na iyi ndụ egwu na ikesa ngwaagha.
Usoro ndị a metụtara mmadụ niile nakwa ụlọọrụ niile nọ gburugburu Naịjirịa.
E bipụtara ozi ahụ dịka ndị ọchịchị Naịjirịa malitere ikpe ndị a na-enyo enyo karịrị narị ise (500) ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu, nke bụ ọnụọgụ mmadụ kachasị a na-ekpe ụdịrị ikpe ahụ na Naịjirịa.
Ka ọ dị ugbua, a maala mmadụ narị atọ na iri asatọ na isii (386) ikpe maka iyi ndụ egwu.
Mmadụ ndị ahụ a na-ekpe ikpe ka e boro ebubo ndị metụtara ịkwado ndịagha nnupụisi, ọkachasị na mpaghara Ugwu Ọwụwa Anyanwụ, bụ ebe ndị otu Boko Haram malitere iyi ndụ egwu kemgbe ihe karịrị afọ iri.
Kemgbe ahụ, ọgbaaghara esila na mpaghara ahụ fesaa na mpaghara ndị ọzọ, dịka ọtụtụ otu ndị ojiegbe na-eme mwakpo na ndị ntọrị na-atọ ọtụtụ mmadụ iji nara ego mgbapụta gburugburu Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Na nso nso a ka gọọmenti kwupụtara ndị ojiegbe dịka otu na-eyi ndụ egwu, ma gbasaa ogogo atụmatụ ha ji ebu agha megide iyi ndụ egwu.
N'agbanyeghị ogogo mwakpo ọjọọ a na-eme gburugburu Naịjirịa, ọ rara ahụ ịhụ ka a na-ekpe ndị omekome mere ya ikpe.
Oge ụfọdụ ka a na-ejichi ndị a na-enyo enyo ruo ogologo oge na-ekpeghị ha ikpe, nke mere ndị mmadụ ji na-enwe mmetụta gbasara inye ezi ngụkọ nakwa ime ihe n'ụzọ kwesịrị ekwesị.
Otu ndị dịka Boko Haram, Islamic State West Africa Province (Iswap) na Jama'at Nusrat al-Islam wal-Muslimin (JNIM) na-akpa mkpamkpa n'ọtụtụ akụkụ mpaghara ugwu, dịka nke a na-akụsasị mbọ ndị a na-agba iji hụ na e weghachiri udo na mpaghara ahụ.
N'ime ọnwa ndị na-adịbeghị anya ka ọgbaaghara fesara, karịa n'ebe ndị e ji ụdịrị ọnọdụ ahụ mara.
Nke a na-eme n'oge mba ahụ na-agba mbọ ibu agha megide tigbuo zọgbuo na-arị elu kwa ụbọchị.
Gọọmenti mba Amerịka nọọrọ n'ime izuụka gara aga dọọ ụmụafọ ha aka na ntị ka ha chegharịa echiche gbasara ime njem gaa Naịjirịa.
Ha rụtụrụ aka n'ụfọdụ ihe izendụ dị n'ime njem gaa Naịjirịa, nke gụnyere iyi ndụ egwu, ntọrị nakwa ọgbaaghara.



























