Ihe i kwesịrị ịma maka nje Covid 19 ọhụrụ batara na Naịjirịa

Aha onyonyo, Ihe i kwesịrị ịma maka nje Covid 19 ọhụrụ batara na Naịjirịa
Ihe i kwesịrị ịma maka nje Covid 19 ọhụrụ batara na Naịjirịa

Ịma na nje covid-19 ezebatala isi ọzọ na Naịjirịa?

N'ụbọchị 17 Eprel 2026 ka a chọpụtara nje covid-19 n'ahụ otu nwaafọ mba Chaịna bịara ịrụ ọrụ na Kalaba, dịka o gosichara ụfọdụ njirimara ọrịa ahụ.

Onyeisi ụlọọrụ na-ebu agha megide mfesa ọrịa na naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) bụ Dr. Jide Idris kwuru na e dowere nwaamadị ahụ iche ma na-elekọta ya anya site n'ụkpụrụ nlekọta nke Gọọmentị Etiti.

Mana a bịara nụ kepu kepu na mmadụ iri ọhụrụ ebutela ọrịa covid-19 na Krọs Riva Steeti bụ nke mere gọọmenti steeti ahụ jiri pụta kwuo na ọ bụghị eziokwu, kama, nwaafọ mba Chaịna bu ọrịa ahụ na-enweta onwe ya nke ọma, dịka a na-elebara ndị ahụ ha na ya metụrụ anya nke ọma ruo opekatampe, ụbọchị iri na anọ.

Ugbua, ka anyị kpọlaa echiche gị azụ gbasara ọrịa covid-19

Covid-19 bụ ọrịa na-efe efe ma na-egbukwa mmadụ. A chọpụtara ya n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna n'afọ 2019.

A na-ebute covid-19 site n'ikwe n'aka, uzere na ụkwara, ebe mmadụ nwekwara ike ikute ọrịa a n'ume ma ọ bụrụ na o kuru ume onye bu ọrịa a.

Njirimara ya gụnyere ahụọkụ, ike ọgwụgwụ, ụkwara, ahụ mgbu, azụzụ, ọnya akpịrị, afọ ọsịsa na ekughị ume nke ọma, mana ụfọdụ mmadụ anaghị egosipụta njirimara ọbụla, ebe ọ bụghịkwa mmadụ niile na-anata ọgwụgwọ tupu ha agbakee.

Ọrịa a fesara n'ụwa niile n'ime afọ 2020, dịka o rutere Naijiria n'ụbọchị 27 Febụwarị 2020, mgbe otu nwoke bụ nwaamala Itali bịara Legọs.

Ọnọdụ a mere ka gọọmentị mba dị iche iche gụnyere Naịjirịa gbachie ọtụtụ obodo n'afọ 2020 dịka akụkụ mbọ ha gbara ibelata mfesa ọrịa ahụ na mbaụwa.

Ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ (200,000) butere covid-19 na Naịjirịa, ebe mmadụ karịrị puku atọ (3,000) nwụrụ.

Ụfọdụ ndị a ma ama nwụrụ n'ihi n'ọrịa covid-19 gụnyere Abba Kyari bụ nwanne Onyeisiala Muhammadu Buhari, Abiola Ajimobi bụbu gọvano Oyo Steeti, Yinka Odumakin bụ ọgba mbọ maka ikike dịịrị onye, Dan Foster na-agwakọ egwu nakwa ndị ọzọ.